Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Nifaị Nwa-nwoke nke Lihaị


Nifaị Nwa-nwoke nke Lihaị

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, otu nwa-nwoke nke Lihaị na Saraịa onye ezi-omume (1 Nif. 1:1–4; 2:5). Nifaị nwere okwukwe siri ike n’okwu nke Chineke (1 Nif. 3:7) na bịa bụrụ nnukwu onye-amụma, onye na-edobe akụkọ ndekọta, na onye-ndu nke ndị ya.

Akwụkwọ nke 1 Nifaị

Isi nile nke 1 ruo 18:8 bụ nke kachasị na-ekwu maka onye amụma Lihaị na ezi-na ụlọ ya ihapụ Jerusalem. Ha jere njem site n’ọzara nile tọgbọ n’efu tutu ha e ruo oke osimiri. 1 Nifaị 18:9–23 na-akọ maka njem ụgbọ mmiri ha gaa n’otu ala e kwere na nkwa, dịka ntụzi-aka nke Onye-nwe, na-agbanyeghị nnupụ-isi nke Leman na Lemuel. Isi nile nke 19–22 kọrọ nzube nke Nifaị maka idobe akụkọ ndekọta nile (1 Nif. 6:1–6; 19:18)—iji gbaa mmadụ nile ume ka ha cheta Onye-nwe bụ onye mgbapụta ha. O n̄omiri Aịsaịa (1 Nif. 20–21) na kọwakwara ozi Aịsaịa nile, jirị olile-anya na mmadụ nile ga-abịa mata Jisus Kraịst dịka Onye-Nzọpụta ha na Onye-mgbapụta ha (1 Nif. 22:12).

Akwụkwọ nke 2 Nifaị

Isi nile nke 1–4 nwere ụfọdụ n’ime ngwụcha nkụzi nile na ibu amụma nile nke Lihaị tutu ọnwụ ya, tinyere ngọzi nile n’elu ụmụ ya ndịkom na ụmụ ụmụ ha. Isi nke 5 na-akọwa ihe mere ndị Nifaị ji kewapụ onwe ha site na ndị Leman. Ndị Nifaị rụrụ otu temple, kụzie iwu nke Moses, na dobe akụkọ ndekọta nile. Isi nile nke 6–10 nwere okwu nile nke Jekọb, nwanne nwoke nke Nifaị nke ka nta. Jekọb legharịrị akụkọ nke Juda anya na buo amụma banyere Mesaịa ahụ, ụfọdụ nke bụ ndị e wetara site na edemede nile nke Onye amụma Aịsaịa. N’ime isi nile nke 11–33. Nifaị dekọtara ọgbụgba-ama ya banyere Kraịst, ọgbụgba-ama Jekọb, ibu amụma nile nke ụbọchị ndị ikpe-azụ, na ọtụtụ isi nile sitere n’akwụkwọ Testament Ochie nke Aịsaịa.

Epekele nile nke Nifaị

Hụ Epekele nile