Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọgbụgba-ndụ


Ọgbụgba-ndụ

Nkwekọrịta dị n’etiti Chineke na mmadụ, mana ha anaghị eme omume ka ndị ha-otu na nkwekọrịta ahụ. Chineke na-enye ọnọdụ nile maka Ọgbụgba-ndụ ahụ na ndị mmadụ na-ekwere ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Chineke mgbe ahụ na-ekwe ndị mmadụ nkwa ụfọdụ ngọzi nile n’ihi nrube isi ha.

Ụkpụrụ nile na emume nsọ nile ka a na-enweta site na ọgbụgba-ndụ. Ndị otu nile nke Nzukọ-nsọ ndị mere ụdị ọgbụgba-ndụ ndị ahụ na-ekwe nkwa idebe ha. Iji maa-atụ, ndị otu na-agba ndụ nye Onye-nwe na baptism ma megharịa ọgbụgba-ndụ ndị ahụ ọhụrụ site na-iso nara oriri-nsọ. Ha na emekwasi ọgbụgba-ndụ ndị ọzọ n’ime temple. Ndị nke Onye-nwe na-abụ ndị ọgbụgba-ndụ na na-abụ ndị a gọziri agọzi nke ukwuu mgbe ha na-edobe ọgbụgba-ndụ ha nile nye Onye-nwe.