Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa


Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa

Ala-eze Chineke n’elu ụwa ka a tunyeere otu “ọla pel nke oke ọnụ ahịa” (Mat. 13:45–46).

Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa bụ kwa aha e nyere otu n’ime ibu akwụkwọ anọ nke akwụkwọ-nsọ nke a kpọrọ ọkọlọtọ-ọrụ n’ile nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a. Nleba-anya nke mbụ nke Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa ka e bipụtara na 1851 ma o nwekwaara ụfọdụ ngwo ngwo ya dị ugbua n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile. Nleba-anya nile e bipụtara ke mgbe 1902 nwere (1) ihe nile a họọrọ site na ntụgharị asụsụ nke Joseph Smith nke Jenesis, nke a kpọrọ Akwụkwọ nke Moses, na nke Matiu 24, nke a kpọrọ Joseph Smith—Matiu; (2) Ntụghari asụsụ nke Joseph Smith nke ụfọdụ akwụkwọ papịrọs ndị Ijipt nke o nwetara n’afọ 1835, nke a kpọrọ Akwụkwọ nke Abraham; (3) Otu ihe a họọrọ site na akụkọ Joseph Smith nke Nzukọ-nsọ nke o dere n’afọ 1838, nke a kpọrọ Akụkọ—Joseph Smith; na (4) Ndepụta nke Okwukwe, okwu ndepụta iri na atọ nke ihe e kweere na ozizi.