Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Akwụkwọ-nsọ nile


Akwụkwọ-nsọ nile

Okwu nile ma nke e dere ede na nke e kwuru ekwu, site n’aka ndị nwoke nke Chineke dị nsọ mgbe Mụọ Nsọ kwalitere ha. Akwụkwọ-nsọ kanọn nile a nabatara n’ụlọ-ọrụ nke Nzukọ-nsọ taa gụnyere Bible, Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa. Jisus na ndị dere Testament Ọhụrụ lere akwụkwọ nile nke Testament Ochie anya dịka akwụkwọ-nsọ nile (Mat. 22:29; Jọn 5:39; 2 Tim. 3:15; 2 Pita 1:20–21).

Akwụkwọ-nsọ nile furu-efu

E nwere ọtụtụ edemede nile dị nsọ a kpọtụrụ aha n’ime akwụkwọ-nsọ nile nke anyị na-enweghị taa, n’ime ha bu akwụkwọ ndị a na ndị dere ha, Ọgbụgba-ndụ ahụ (Ọpụ. 24:7), Agha nile nke Onye-nwe (Ọnọgụ. 21:14), Jasher (Joshua 10:13; 2 Sam. 1:18), Ọlụ nile nke Solomọn (1 Ndez. 11:41), Samuel Onye Ọhụ-uzo (1 Ihem. 29:29), Netan Onye-amụma (2 Ihem. 9:29), Shemaịa Onye-amụma (2 Ihem. 12:15), Ido Onye-amụma (2 Ihem. 13:22), Jehu (2 Ihem. 20:34), Okwu nile nke ndị ọhụ-ụzọ (2 Ihem. 33:19), Inọk (Jud 1:14), na Okwu nile nke Zinọk, Neum na Zinọs (1 Nif. 19:10), Zinọs (Jekọb 5:1), Zinọk na Ezaịas (Hil. 8:20), na otu Akwụkwọ Ncheta (Moses 6:5); na akwụkwọ-ozi nile e degaara Ndị Kọrịnt (1 Ndị-Kọ 5:9), e degaara Ndị-Efesọs (Ndị-Efe. 3:3), na site na Leọdisia (Ndị-Kọl. 4:16).

Akwụkwọ-nsọ nile ka a ga-echekwa

Afọ-ojuju (uru) nke akwụkwọ nsọ nile

Akwụkwọ-nsọ nile e buru n’amụma ga-abịa