Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Nehum


Nehum

Otu onye amụma Testament Ochie nke Galili, onye dekọtara ibu amụma ya nile n’oge dịka n’etiti 642 na 606 tutu a mụọ Kraịst.

Akwụkwọ nke Nehum

Isi nke 1 na-ekwu banyere iji ọku rechapụ ụwa n’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ na obi ebere na ike nke Onye-nwe. Isi nke 2 na-akọ maka mbibi nke Nineve, nke bụ onyinyo bụ ụzọ nke ihe nke ga-abịa n’ụbọchị ndị ikpe-azụ. Isi nke 3 gara n’iru na ebu ụzọ ekwu maka mbibi na-enweghị an̄uri nke Nineve.