Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Israel


Israel

Onye-nwe nyere Jekọb aha ahụ Israel, nwa-nwoke nke Aịsak na nwa nwa nke Abraham n’ime Testament Ochie (Jen. 32:28; 35:10). Aha ahụ Israel nwere ike ịtụnyere Jekọb n’onwe ya, ụmụ ụmụ ya, ma-ọbụ ala-eze ahụ nke ụmụ ụmụ ahụ nwere n’ime oge nile nke Testament Ochie (2 Sam. 1:24; 23:3). Mgbe Moses duputasịrị ụmụ Israel site n’oru ndị Ijipt (Ọpụ. 3–14), ndị-ikpe wee chịa ha ruo ihe karịrị narị afọ atọ. Malite na Eze Sọl, ndị eze chịrị Israel ejikọrọ n’otu ruo na ọnwụ Solomon, mgbe agbụrụ iri sitere na Rehoboam nupurụ-isi iji hiwe mba nke dị iche. Mgbe e kewasịchara ala-eze nke Israel, agbụrụ nile nke mpaghara elu elu dịka mpaghara nke ka ibu ibu, dobere aha ahụ Israel, ebe ala-eze nke ndịda ka a kpọrọ Juda. Ala nke Kenean ka a na-akpọkwa Israel taa. N’uche nke ọzọ, Israel pụtara ezi onye kwere-ekwe na Kraịst (Ndị-Rom 10:1; 11:7; Ndị-Gal. 6:16; Ndị-Efe. 2:12).

Agbụrụ Iri na-abụọ nke Israel

Jekọb nwa nwa nke Abraham, onye a gbanwere aha ya ịbụrụ Israel, nwere ụmụ ndịkom iri na abụọ. Ụmụ ụmụ ha abụrụwo ndị a maara dịka agbụrụ iri na abụọ nke Israel ma-ọbụ ụmụ Israel. Ndị a bụ agbụrụ iri na abụọ ahụ: Ruben, Simiọn, Livaị, Juda, Isaka, na Zebulọn (ụmụ ndịkom Jekọb na Lia); Dan na Neftali (ụmụ ndịkom nke Jekọb na Bilha); Gad na Asha (ụmụ ndịkom nke Jekọb na Zilpa); Josef na Benjamịn (ụmụ ndịkom nke Jekọb na Rachel) (Jen. 29:32–30:24; 35:16–18).

Tutu ya anwụọ Jekọb nyere onye-isi agbụrụ ọbụla ngọzi (Jen. 49:1–28). Maka nkọwa ọzọ tinyere nke a, hụ aha otu nwa-nwoke ọbụla nke Jekọb.

Ruben, ọkpara mbụ nke Lia nwunye mbụ nke Jekọb, ka ọnọdụ ọkpara ya na oke abụọ ya funarịrị n’ihi ndụ ezighị-ezi nke mụọ (Jen. 49:3–4). Ọnọdụ ọkpara ahụ mgbe ahụ a gaara Josef, onye bụụrụ nwa-nwoke mbụ nke nwunye Jekọb nke abụọ Rachel (1 Ihem. 5:1–2). Livaị onye Onye-nwe họrọworo agbụrụ ya ife ofufe dịka ndị na-eje ozi n’ọkwa nchụ-aja, a natagh ihe nketa n’ihi ọkpụkpọ pụrụ iche nke ha ije-ozị n’etiti agbụrụ ahụ nile. Nke a mere ka oke abụọ nke Josef bụrụ nke ụmụ ya ndịkom Ifrem na Manase ketara (1 Ihem. 5:1; Jer. 31:9), ndị a gụrụ dịka agbụrụ dị iche nke Israel (NAJS, Jen. 48:5–6).

Ndị nke agbụrụ Juda ga-abụrụ ndị ọchịchị ruo mgbe Mesaia ahụ bịara (Jen. 49:10; NAJS, Jen. 50:24). N’ụbọchị ndị ikpe-azụ agbụrụ Ifrem nwere ohere nke iburu ozi nke mweghachi nke ozi-ọma ga nye ụwa na mkpọkọta nke Israel a gbasasịrị agbasa (Deut. 33:13–17). Oge ahụ ga-abịa mgbe site n’ozi-ọma nke Jisus Kraịst, Ifrem ga-enwe ọnọdụ ime omume onye nduzi n’ijikọta agbụrụ nile nke Israel (Aịsa. 11:12–13; OznỌd. 133:26–34).

Mkposasị nke Israel

Onye-nwe kposasịrị na sogbuo agbụrụ iri na abụọ nke Israel n’ihi omume na-ezighị-ezi na nnupụ-isi ha. Otu o sila dị, Onye-nwe jiri mkposasị nke a nke ndị ya ọ họọrọ n’etiti mba nile nke ụwa na-agọzi mba ndia nile.

Mkpọkọta nke Israel

A ga-akpọkọta ụlọ nke Israel ọnụ n’ụbọchị ndị ikpe-azụ tutu ọbịbịa nke Kraịst (Ndep. Ok 1:10). Onye-nwe na-akpọkọta ndị ya Israel mgbe ha nabatara ya na dobe iwu-nsọ ya nile.

Agbụrụ iri nke Israel furu-efu

Agbụrụ iri nke Israel mejupụtara ala-eze mpaghara elu-elu nke Israel ma e bupụrụ ha ga na ndọkpụ n’agha n’ime Asiria n’afọ 721 tutu amụọ Kraịst. N’oge ahụ, ha gara na mba nile ndị dị n’elu-elu na bia bụrụ ndị mmata banyere ha funarịrị ndị ọzọ. N’ụbọchị ndị ikpe-azụ ha ga-alọta.