Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụlọ akụ


Ụlọ akụ

Ebe ahụ nke Onye ụkọchukwu na-anata, jide na ntụkwasị-obi, na-enyepụkwa nye ndị ogbenye onyinye nile e doro nsọ nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ. Ụlọ-akụ ọbụla nwere ike ịdị ukwuu ma-ọbụ dị nta dịka ọnọdụ siri chọọ. Ndị-nsọ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye onyinye nile, ịkwa nka nile, ihe nile na ụzọ ego ha nile n’aka onye ụkọchukwu iji lekọta ndị ogbenye n’oge ha chọrọ enyem-aka. Ya mere, Ụlọ-akụ nwere ike ịgụnye ndepụta nke ije-ozị nile ga-eru aka, ego, ihe oriri, ma-ọbụ ihe ndị-ọzọ nile. Onye ụkọchukwu ahụ bụ onye na-elekọta ụlọ-akụ ahụ na-ekesakwa ngwa ahịa nile na ije-ozị nile dịka e si chọọ enyem-aka na dịka Mụọ nke Onye-nwe duziri (OznỌd. 42:29–36; 82:14–19).