Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Testament Ọhụrụ


Testament Ọhụrụ

Otu nchịkọta nke edemede nile nwere nkwalite nke Mụọ (na mmalite bụ n’asụsụ Grik) banyere ndụ na ije-ozị nke Jisus Kraịst, Ndị-ozi ahu, na ndị ọzọ nile na-eso Jisus Kraịst. Testament Ọhụrụ n’ozuzu-ọha ka, e kewasịrị ịbụ Ozi-Ọma nile, ọlụ nile nke Ndị-ozi, Akwụkwọ ozi nile nke Pọl, Akwụkwọ-ozi nile n’ọha, na akwụkwọ nke Mkpughe.

Ozi-ọma anọ ahụ nile—Akwụkwọ nile nke Matiu, Mak, Luk, na Jọn—ha bụ nkọwasị nile nke ndụ nke Kraịst. Akwụkwọ nke Ọlụ Ndị-ozi dekọtara akụkọ nke Nzukọ-nsọ na Ndị-ozi, nke ka nke njem mgbasa ozi-ọma nile nke Pọl, mgbe ọnwụ Kraịst gasịrị. Leta nile nke Pọl na-enye ndị ndu na ndị otu Nzukọ-nsọ ntụzi-aka. Leta ndị nke ọzọ bụ Ndị-Ozi ndị ọzọ dere ha ma na-enye mgbakwụnye ndụmọdụ nye Ndi-nsọ mgbe mmalite ahụ. Akwụkwọ nke Mkpughe, nke Onye-ozi Jọn dere, nwere karịsịa ibu amụma nile gbasara ụbọchị ndị ikpe-azụ.