Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Nzukọ nke Jisus Kraịst


Nzukọ nke Jisus Kraịst

Otu ọgbakọ a haziri nke ọma nke ndị kwere ekwe ndị wekwasịworo onwe ha aha nke Jisus Kraịst site na baptism na ime onye-otu. Ịbụ ezi Nzukọ-nsọ ahụ, ọ ga-abụrịrị Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe, Ọ ga-enwerịrị ikike ya, nkuzi nile, iwu nile, emume nsọ nile na aha; ma ọ ga-achịrịrị ya n’onwe ya site na ndị nnọchite anya ndị o nyere ọkwa.