Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Malakaị


Malakaị

Otu onye-amụma Testament Ochie onye dere akwụkwọ ma buo amụma na ihe dịka 430 tutu a mụọ Kraịst.

Akwụkwọ nke Malakaị

Akwụkwọ ma-ọbụ ibu-amụma nke Malakaị bụ akwụkwọ nke ikpe-azụ dị n’ime Testament Ochie. Ọ dịka ọ na-eso isi okwu anọ pụtara ìhè: (1) Mmehie nile nke Israel—Malakaị 1:6–2:17; 3:8–9; (2) Ikpe nile ga-abịakwasị Israel n’ihi e rubeghị-isi ha—Malakaị 1:14; 2:2–3, 12; 3:5; (3) Nkwa ahụ nile maka irube-isi—Malakaị 3:10–12, 16–18; 4:2–3; na (4) Ibu-amụma nile gbasara Israel—Malakaị 3:1–5; 4:1, 5–6 (OznỌd. 2; 128:17; A—JS 1:37–39).

N’ibu-amụma ya, Malakaị dere maka Jọn ome baptism (Mal. 3:1; Mat. 11:10), iwu nke ịkwụ otu ụzọ n’ime ụzọ iri (Mal. 3:7–12), Ọbịbia nke ugboro abụọ nke Onye-nwe (Mal. 4:5), mbịaghachi nke Elaịja (Mal. 4:5–6; OznỌd. 2; 128:17; A—JS 1:37–39). Onye-nzọpụta n̄omiri Malakai isi nile nke 3 na nke 4 nye ndị Nifaị (3 Nif. 24–25).