Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile


Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile

Nchikọta nke mkpughe nile dị nsọ n’ụbọchị ikpeazụ a, na nkwupụta nile nke nkwalite mụọ. Onye-nwe nyere Joseph Smith ihe ndị a na ọtụtụ n’ime ndị nọchiri anya ya maka nhiwe na nhazi nke ala-eze Chineke n’elu ụwa n’ụbọchị ndị ikpe-azụ a. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile bụ otu n’ime ọkọlọtọ-ọrụ nile nke akwụkwọ nsọ n’ime Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nso Ụbọchị-Ikpeazụ a, ya na Bible, Akwụkwọ nke Mọmọn, na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa. Otu o sila dị, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile pụrụ iche n’ihi na-ọbụghị ntụgharị asụsụ nke dọkumenti ochie nile; Onye-nwe nyere mkpughe ndị a nile n’aka ndị amụma ya ọ họpụtara n’ụbọchị ọ lọrọ ọhụrụ nke a maka iji wetaghachi ala-eze ya. N’ime mkpughe ndị a nile a na-anụ olu dị nro mana olu na-ekwusi ike nke Onye-nwe Jisus Kraịst (OznỌd. 18:35–36).

Onye-amụma Joseph Smith kwuru na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile bụụrụ ntọ-ala nke Nzukọ-nsọ n’ụbọchị ndị ikpe-azụ ndịa na ihe nrite-uru nye ụwa (OznỌd. 70:Isi-ọkwu). Mkpughe nile dị na ya na amalite ọrụ nke ikwadobe ụzọ maka ọbịbịa Onye-nwe nke ugboro abụọ, iji mejupụta okwu nile nke ndị amụma kwuru site na mgbe ụwa malitere.