Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọhụ-ụzọ


Ọhụ-ụzọ

Otu onye Chineke nyere ikike iji anya nke mụọ na-ahụ ihe nile Chineke zopụrụ site n’ụwa (Moses 6:35–38). Ọ bụ onye-mkpughe na onye-amụma, (Mosa. 8:13–16). N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, Amọn kuziri na nanị onye ọhụ-ụzọ nwere ike iji ihe ntụgharị asụsụ nile pụrụ iche, ma-ọbụ Urim na Tumim (Mosa. 8:13; 28:16). Ọhụ-ụzọ maara maka mgbe gara-aga, ugbua na ọdị n’iru. Na mgbe ochie onye-amụma ka a naara akpọkarị ọhụ-ụzọ (1 Sam. 9:9; 2 Sam. 24:11).

Joseph Smith bụ nnukwu ọhụ-ụzọ nke ụbọchị nile ikpeazụ (OznỌd. 21:1; 135:3). N’igbakọnye ya, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na Kansụl nke Iri na Abụọ ahụ ka a na-akwado dịka ndị-amụma, ndị ọhụ-ụzọ, na ndị mkpughe.