Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Beal


Beal

Otu chi-nwoke nke anyanwụ nke ndị Fonisia na-efe ofufe (1 Ndez. 16:31) mana a na-efe kwa ya ofufe n’ụzọ dị iche-iche n’ọtụtụ ebe: Ndị Moab, dịka Beal-pịọ (Ọnọgụ. 25:1–3), na Shekem dịka Beal-berit (Ndikp. 8:33; 9:4), na Ekron dịka Beal-zebọb (2 Ndez. 1:2). Beal nwere ike ịbụ otu ihe ahụ dịka Bel nke Babịlọn na Zeus nke Gris. Okwu ahụ Beal na-ezipụta mmekọrịta dị n’etiti otu onye-nwe na ọru ya. Akara Beal na-abụkarị Otu oke-ehi. Ashtọret bu chi nwanyị, a na-efe ya na Beal n’ọha.

Oge ụfọdụ a na-akpọkọ Beal na aha ọzọ ma-ọbụ okwu ọzọ iji gosi mmekọta ya na Beal, dịka ebe a na-efe ya ofufe ma-ọbụ mmadụ nwere ọdịdị ka nke Beal. N’ikpe-azụ n’ihi na Beal bịara pụtazie oke ihe ọjọọ nile, okwu ahụ Bọshet gbanwere ya na ụdị aha nile ndị ahụ. Bọshet pụtara “ihere”.