Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Juu


Ndị Juu

Ndị Juu nwere ike ịbụ (1) ụmụ ụmụ nke Juda, otu n’ime ụmụ ndịkom iri na abụọ nke Jekob, (2) ndị ochie nke ala-eze mpaghara ala-ala nke Juda, ma-ọbụ (3) ndị mmadụ na-ekpe okpukpe chi, ụdị ibi ndụ, na ọdịnala nile nke ndị Juda mana ha nwere ike ịbụ ma-ọbụ ghara ịbụ ndị Juu na-ọmụmụ. Ọ bụrụla omenala iji okwu ahụ Juu na-atụnyere ụmụ ụmụ Jekọb nile, mana nke a bụ imehie ihe. E kwesịrị ịhapụrụ ya nanị ndị ahụ bụ ndị ala-eze nke Juda ma-ọbụ, nke kacha nke taa, ndị ahụ bụ ndị agbụrụ nke Juda na ndị ahụ Ya na ha mekọtara ihe.