Omume nke mmadụ ibikwasị aka abụọ n’elu isi mmadụ dịka mpaghara emume-nsọ nke ọkwa nchụ-aja. Ọtụtụ emume-nsọ nile nke ọkwa nchụ-aja ka a na-eme site na-ibikwasị aka abuọ n’isi, dịka echichi nile, nlekọta ndị nrịrịa, ime onye otu Nzukọ-nsọ, na inyefe Mụọ Nso ahụ.
Moses wee bikwasị Joshua aka ya abụọ n’isi, dịka Onye-nwe nyere ya iwu, Ọnọgụ. 27:18, 22–23 (Deut. 34:9 ).
Jisus bikwasịrị ndị nrịrịa ole na ole aka ya abụọ wee mee ka arụ dị ha ike, Mak 6:5 (Mọm. 9:24 ).
Ndị-ozi wee bikwasị mmadụ asaa ahụ bụ ndị ga-enyere ha aka ha nile n’isi, Ọlndoz. 6:5–6 .
Mụọ Nsọ ka a na-enye site n’ibikwasị aka n’isi, Ọlndoz. 8:14–17 .
Ananaias wee bikwasị Sọl aka ya abụọ n’isi ma wee mee ka ọ hụ ụzọ, Ọlndoz. 9:12, 17–18 .
Pọl bikwasịrị ya aka ya abụọ ma mee ka arụ dị ya ike, Ọlndoz. 28:8 .
Pọl wee kuzie ozizi nke ime baptism na nke ibikwasị-aka n’isi, Ndị-Hib. 6:2 .
Alma chiri ndị nchụ-aja na ndị okenye echichi site na-ibikwasị aka ya abụọ, Alma 6:1 .
Jisus nyere ndị na-eso ụzọ ya ike inyefe Mụọ Nsọ site na-ibikwasị aka nile, 3 Nif. 18:36–37 .
Onye ọbụla unu ga-ebikwasị aka unu n’isi ya, unu ga-enye ya Mụọ Nsọ, Moro. 2:2 .