Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Zekaraịa


Zekaraịa

Otu onye-amụma Testament Ochie onye buru amụma gburu gburu 520 tutu a mụọ Kraịst. O biri ndụ n’otu oge ahụ dịka onye-amụma Hagaị (Ezra 5:1; 6:14).

Akwụkwọ nke Zekaraịa

E ribara akwụkwọ ahụ ama n’ihi ibu-amụma ya nile maka ije-ozị nke Kraịst n’arụ na-anwụ anwụ na nke ọbịbịa ya nke ugboro abụọ (Zek. 9:9; 11:12–13; 12:10; 13:6). Isi nile nke 1–8 nwere otu usoro ọ̀hụ́ nile nke ọdị n’iru nke ndị nke Chineke. Isi nile nke 9–14 nwere ọhụ nile banyere Mesaịa ahụ, ụbọchị ndị ikpe-azụ, mkpọkọta nke Israel, nnukwu agha ikpe-azụ ahụ, na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ahụ.