Usoro oge na ebe nile na ihe-omume nile
Usoro oge, na ebe nile, na ihe-omume nile ma-ọbụ ndepụta nke ihe-omume nile nke a na-eso, e zuchaghị-ezu ma ebum n’uche ya bụ nanị inye onye na-agụ echiche nke usoro nke ihe omume nile n’oge nile nke Bible na Akwụkwọ nke Mọmọn:
|
Ihe omume nile gboo n’ụbọchị nile nke ndị-Isi-ezi-na ulọ: (N’ihi otu o si dị ike ịmata kpọm-kwem akara na-egosi oge nile nke ihe omume nile na nkeji nke a, e nyeghị kwa akara na-egosi oge.) | |
|
Tutu a mụ Kraịst b.c. (ma-ọbụ b.c.e. Tutu Ọgbọ Ọha) | |
|
4000 |
Adam dara. |
|
Inọk kwusara ozi-ọma. | |
|
Noa kwusara ozi-ọma; ide mmiri jupụtara ụwa. | |
|
E wuru Ụlọ-elu Tọwa Bebel; Ndị Jared jere njem gaa n’Ala ekwere na nkwa. | |
|
Melkizedek kwusara ozi-ọma. | |
|
Noa nwụrụ. | |
|
A mụrụ Abram (Abraham). | |
|
A mụrụ Aịsak. | |
|
A mụrụ Jekọb. | |
|
A mụrụ Josef. | |
|
E rere Josef gaa n’Ijipt. | |
|
Josef pụtara n’iru Fero. | |
|
Jekọb (Israel) na ezi na ụlọ ya gbadara n’Ijipt. | |
|
Jekọb (Israel) nwụrụ. | |
|
Josef nwụrụ. | |
|
A mụrụ Moses. | |
|
Moses duuru ụmụ Israel pụọ n’Ijipt (Ọpụpụ ahụ). | |
|
E nwogharịrị Moses. | |
|
Joshua wee nwụọ. | |
|
Mgbe Joshua nwụsịrị, oge nke ndị-ikpe wee malite, onye-ikpe nke mbụ bụụrụ Otniel ma onye ikpe-azụ bụụrụ Samuel, usoro na akara na-egosi oge nile nke ndị ọzọ e doghị anya. | |
|
E tere Sọl mmanụ ịbụ eze. | |
|
Ihe Omume nile nke Ala-eze e Jikọrọ-ọnụ nke Israel: | |
|
1095 |
Ọchịchị Sọl malitere. |
|
1063 |
Samuel tere Devid mmanụ ịbụ eze. |
|
1055 |
Devid abụrụ eze na Hebrọn. |
|
1047 |
Devid abụrụ eze na Jerusalem; Netan na Gad buru amụma. |
|
1015 |
Solomon abụrụ eze nke Israel nile. |
|
991 |
A rụchara Temple ahụ. |
|
975 |
Solomọn nwụrụ; agbụrụ iri nile nke elu-elu nupuru isi megide Rehoboam, nwa ya nwoke, na ekewasịrị Israel. |
|
Ihe Omume nile nke Israel: |
Ihe Omume nile nke Juda: |
Ihe Omume nile nke Akụkọ Akwụkwọ nke Mọmọn: | |||
|---|---|---|---|---|---|
|
975 |
Jeroboam bụụrụ eze. | ||||
|
949 |
Shishak, eze nke Ijipt pụnarịrị Jerusalem arịa n’aghụghọ. | ||||
|
875 |
Ehab chịrị-eze na Sameria ofe elu-elu Israel, Elaịja buru amụma. | ||||
|
851 |
Elaisha rụrụ nnukwu ọrụ ebube nile. | ||||
|
792 |
Emọs buru amụma. | ||||
|
790 |
Jona na Hosea buru amụma. | ||||
|
740 |
Aịsaịa malitere ibu amụma. (A chọpụtara Rom; Nebonesa bụụrụ eze nke Babịlọn n’afọ 747; Taiglat Pailesa Ⅲ bụụrụ eze nke Asiria site 747 ruo 734.) | ||||
|
728 |
Hezekaia bụụrụ eze nke Juda. (Shelmaneza Ⅳ bụụrụ eze nke Asiria.) | ||||
|
721 |
Ala-eze nke Elu-elu ka e bibiri; agbụrụ iri ahụ nile ka a dọkpụụrụ n’agha; Maịka buru amụma. | ||||
|
642 |
Nehum buru amụma. | ||||
|
628 |
Jeremaịa na Zefanaịa buru amụma. | ||||
|
609 |
Obadaịa buru amụma; E buuru Daniel na ndọkpụ n’agha gaa Babịlọn. (Nineve dara n’afọ 606, Nebukadneza bụụrụ eze nke Babịlọn site afọ 604 ruo 561.) | ||||
|
600 |
Lihaị hapụrụ Jerusalem. | ||||
|
598 |
Ezikiel buru amụma na Babịlọn; Habakuk buru amụma; Zedekaịa bụụrụ eze nke Juda. | ||||
|
588 |
Mulek pụrụ site na Jerusalem gawa obodo e kwere na nkwa. | ||||
|
588 |
Ndị Nifaị kewapụrụ onwe ha site na ndị Leman (n’etiti 588 na 570). | ||||
|
587 |
Nebukadneza nwụdere Jerusalem. | ||||
|
Ihe Omume nile n’Akụkọ ndị Juu: |
Ihe Omume nile nke Akụkọ Akwụkwọ nke Mọmọn: | ||
|---|---|---|---|
|
537 |
Sairọs nyere iwu-ọkụ na ndị Juu nwere ike ịlọta site na Babịlọn. | ||
|
520 |
Hagaị na Zakaraịa buru amụma. | ||
|
486 |
Esta biri ndụ. | ||
|
458 |
E nyere Ezra ikike ka o mee mgbanwe nile. | ||
|
444 |
Nehemaịa ka e nyere ọkwa ịbụ onye-ọchịchị nke Judea. | ||
|
432 |
Malakai buru amụma. | ||
|
400 |
Jarọm natara epekele ahụ nile. | ||
|
360 |
Ọmnaị natara epekele ahụ nile. | ||
|
332 |
Alexanda (the Great) meriri Siria na Ijipt n’agha, 323 Alexanda nwụrụ. | ||
|
323 |
Alexander nwụrụ. | ||
|
277 |
Septuagint ahụ, ntụgharị asụsụ nke akwụkwọ nsọ nile ndị Juu baa n’asụsụ Grik ka a malitere. | ||
|
167 |
Mataịas onye Makabi nupụrụ isi megide Siria. | ||
|
166 |
Judas Makabios abụrụ onye-ndu ndị Juu. | ||
|
165 |
E mere ka temple dị ọcha ma e dogharịrị ya nsọ; Hanuka malitere. | ||
|
161 |
Judas Makabiọs nwụrụ. | ||
|
148 |
Abịnadaị ka e gburu n’ihi okwukwe ya; Alma hiwekwara Nzukọ-nsọ ahụ ọzọ n’etiti ndị Nifaị. | ||
|
124 |
Benjamịn nyere ndị Nifaị okwu ya nke ikpe-azụ. | ||
|
100 |
Alma nke nta na ụmụ ndịkom nke Mosaịa malitere ọrụ ha. | ||
|
91 |
Ọchịchị nke ndị-ikpe malitere n’etiti ndị Nifaị. | ||
|
63 |
Pọmpi meriri Jerusalem n’agha, na ọchịchị ndị Makabi wee gwụsịa n’Israel. | ||
|
51 |
Kleopatra chịrị-eze. | ||
|
41 |
Herọd na Fasel ka e mere ndị gọvanọ e jikọrọ ọnụ nke Judea. | ||
|
37 |
Herọd abụrụ onye-ndu na Jerusalem. | ||
|
31 |
A lụrụ agha nke Aktium; Agọstọs a bụrụ onye-na-achị nnukwu obodo Rom site 31 tutu a mụ Kraịst ruo 14 ka a mụsịrị Kraịst. | ||
|
30 |
Kleopatra nwụrụ. | ||
|
17 |
Herọd rụgharịrị temple ahụ. | ||
|
6 |
Samuel onye Leman buru amụma maka ọmụmụ nke Kraịst. | ||
|
Ka a mụsịrị Kraịst (ma-ọbụ Ọgbọ ọha): |
Ihe Omume nile nke Akụkọ Akwụkwọ nke Mọmọn: | ||
|---|---|---|---|
|
Tutu a mụọ Kraịst ma-ọbụ Ọgbọ ọha. |
a.d. or c.e. | ||
|
Ọmụmụ nke Kraịst. | |||
|
30 |
Ije-ozị nke Kraịst malitere. | ||
|
33 |
A kpọgburu Kraịst. |
33 ma-ọbụ 34 |
Kraịst ahụ biliteworo n’ọnwụ pụtara ìhè na Amerika. |
|
35 |
A gbanwere Pọl. | ||
|
45 |
Pọl gara njem izisa ozi-ọma nke mbụ ya. | ||
|
58 |
E zigara Pọl Rom. | ||
|
61 |
Akụkọ nke Ọlụ Ndị-ozi gwụsịrị. | ||
|
62 |
A gbara Rom ọkụ; akpagburu Ndị-otu-Kraịst na okpuru Nero. | ||
|
70 |
Ndị-otu-Kraịst hapụrụ Jerusalem gawa na Pela; ndị agha gbara Jerusalem okiri kiri ma nwụde ya. | ||
|
95 |
Domitian kpagburu Ndị-otu-Kraịst. | ||
|
385 |
E bibiri mba ndị Nifaị. | ||
|
421 |
Moronaị zoro epekele nile ahụ. | ||