Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Gad, Nwa-nwoke nke Jekọb


Gad, Nwa-nwoke nke Jekọb

N’ime Testament Ochie, otu nwa nwoke nke Jekọb na Zilpa (Jen. 30:10–11). Ụmụ ụmụ ya bịara bụrụ otu agbụrụ nke Israel.

Agbụrụ nke Gad

Maka ngọzi Jekọb n’arụ nwa ya nwoke Gad, hụ Jen. 49:19. Maka ngọzi Moses n’elu agbụrụ Gad, hụ Deut. 33:20–21. Dịka ngọzi ndị a nile siri dị, ụmụ ụmụ Gad gaara-abụ ebo dike n’agha. Ala nile nke e kenyere ha n’ime ala Kenean nọọrọ n’ọwụwa-anyanwụ nke Osimiri Jọdan na nwekwara ala ịta nri nke ahịhịa mara mma tinyere mmiri dibigara oke.