Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Josef, Di nke Meri


Josef, Di nke Meri

Di nke Meri, nne nke Jisus. Josef bụụrụ nwa-nwa nke Devid (Mat. 1:1–16; Luk 3:23–38) na o biiri na Nazaret. E kweereri na ọ ga-alụ Meri. Ozugbo tutu e ruo alụlụ ha, Meri nwetara nleta site na mụọ-ozi Gebriel, onye kwupụtara na a họrọwo Meri ịbụ nne nke Onye-nzọpụta (Luk 1:26–35). Josef kwa nwetara mkpughe banyere ịdị-nsọ nke ọmụmụ ya (Mat. 1:20–25).

Meri bụụrụ nanị onye murụ Jisus n’ụwa n’ihi na Chineke Nna ahụ bụụrụ nna nke Jisus. Mana ndị Juu chere maka Josef dịka nna Jisus na Jisus mesokwara ya otu ahụ (Luk 2:48, 51). N’ihi na nrọ nile si n’elu-igwe maara ya ọkwa, Josef chekwara ndụ nwa a mụrụ ọhụrụ bụ Jisus site na-ịgbalaga Ijipt (Mat. 2:13–14). Mgbe Herọd nwụsịrị onye mụọ-ozi tuziere Josef aka ka o kụrụ nwata bụ Kraịst laghachi n’Israel (Mat. 2:19–23).