Mgbanwe uche na obi na-eweta àgwà ọhụrụ n’ebe Chineke nọ, n’ebe onwe onye nọ, na nye ndụ n’ozuzu. Nchegharị na-egosi na mmadụ na-atụgharị site n’ihe ọjọọ ma tụgharịa kwa obi na uche-obi ya nye Chineke na-edobe onwe ya nye iwu-nsọ nile na ọchịchọ nile nke Chineke ma jụ mmehie. Ezi nchegharị na-abịa site n’ịhụnanya maka Chineke na ezigbọ ọchịchọ irubere iwu-nsọ ya nile isi. Ndị nile ruru ogo nkọwasị emehiewo ma garịrị echegharị n’usoro inwe ngan’iru ruo nzọpụta. Nanị site n’aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst ka nchegharị anyị ga-adị ire ma Chineke anakwere ya.
Mee nụ nkwupụta nye Onye-nwe, Ezra 10:11 .
Wezuga nụ ihe ọjọọ nke omume unu nile; kwụsị nụ ime ihe ọjọọ, Aịsa. 1:16 .
Chegharịa nụ ma tụgharịa site na njehie unu nile, Ezik. 18:30–31 .
Chegharịa nụ n’ihi na ala-eze elu-igwe dị nsọ, Mat. 3:2 .
On̄u ga-adị n’elu-igwe n’isi otu onye-mmehie nke chegharịrị, Luk 15:7 .
Chineke nyere mmadụ nile iwu n’ebe nile na ha ga-echegharị, Ọlndoz. 17:30 (2 Nif. 9:23 ; 3 Nif. 11:31–40 ; OznỌd. 133:16 ).
Mwute dịka Chineke chọrọ na-arụ ọrụ nchegharị ruo nzọpụta, 2 Ndị-Kọ 7:10 .
Mụọ nke Onye-nwe Onye pụrụ ime ihe nile, ewetawo nnukwu mgbanwe n’ime obi anyị nile, nke mere na anyị enwekwaghị ọchịchọ ime ihe ọjọọ, Mosa. 5:2 .
Ọ bụrụ na o kwupụta mmehie ya nile ma chegharịa, ya ka ị ga-agbaghara, Mosa. 26:29 .
Mgbe Alma kwusachara okwu, ọtụtụ mmadụ malitere ichegharị, Alma 14:1 .
Unu ghara igbu oge maka ụbọchị nchegharị unu, Alma 34:33 .
Alma kuziire Hilaman maka nchegharị na mgbanwe ya, Alma 36 (Mosa. 27:8–32 ).
Nchegharị enweghị ike ịbịakwute ndị mmadụ ma ọbụghị na enwere ntaram-ahụhụ, Alma 42:16 .
Mee ka mmehie gị nile na-esogbu gị, na nsogbu ahụ nke ga-ewedata gị ruo nchegharị, Alma 42:29 .
Unu ga-enye n’ịchụrụ m aja obi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị, 3 Nif. 9:20 .
Onye ọbụla chegharịrị ma bịakwute m dịka nwantakịrị, ya ka m ga-anabata, 3 Nif. 9:22 .
Chegharịa, unu nsọtụ nile nke ụwa, 3 Nif. 27:20 .
Ugboro ole ọbụla nke ha chegharịrị, a gbaghaara ha, Moro. 6:8 .
E kwula ihe ọbụla ma obụghị nchegharị nye ọgbọ nke a, OznỌd. 6:9 (OznỌd. 11:9 ).
Lee otu ịdị ukwuu nke on̄u ya dị na mkpụrụ-obi nke chegharịrị, OznỌd. 18:13 .
Onye ọbụla garịrị echegharị ma-ọbụ taa ahụhụ, OznỌd. 19:4 .
Onye nke mere mmehie ma ghara ichegharị ka a ga-achụpụ, OznỌd. 42:28 .
Onye ahụ nke na-ekwupụta ma hapụ mmehie ya nile, ka a gbaghaworo, OznỌd. 58:42–43 .
Ndị nwụrụ anwụ nke chegharịrị ka a ga-agbapụta, OznỌd. 138:58 .