Akwụkwọ nsọ
Alma 36


Iwu nile nke Alma nyere nwa ya nwoke Hilaman.

Mejupụtara isi 36 na 37.

Isi 36

Alma wee gbaara Hilaman ama maka mgbanwe ya mgbe ọ hụsịworo mụọ-ozi—Ọ tara ahụhụ mgbu nile nke mkpụrụ-obi a mara ikpe; ọ kpọkuru aha nke Jisus, ma e wee mụọ ya site na Chineke—Ọn̄ụ-ụtọ jupụtara mkpụrụ-obi ya—Ọ hụrụ ìgwè ndị mụọ-ozi na-eto Chineke—Ọtụtụ ndị gbanweworo edetuwo ya ire ma hụwo dịka o detụworo ya ire ma hụwo. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.

1 aNwa m nwoke, gee-ntị n’okwu m nile; n’ihi na a na m an̄ụrụ gị iyi, na ọbụrụra na ị ga-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke i ga-eme nke ọma n’ala ahụ.

2 Ọ dị m ka asị na ị ga-eme dịka m meworo, n’icheta ndọkpụ n’agha nke ndị nna anyị ha; n’ihi na ha nọọrọ an’ịbụ-oru, ma ọdịghị onye nwere ike ịnapụta ha ma ọbụghị bChineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb; ma n’ezie ọ napụtara ha na mkpagbu ha nile.

3 Ma ugbua, O nwa m nwoke Hilaman, lee, ị nọ n’okorọbịa gị, ma ya mere, a na m arịọ gị ka i wee nụrụ okwu m nile ma mụta ihe site n’aka m; n’ihi na a matara m na ndị nile ga-etinye ntụkwasị-obi ha na Chineke a ga-akwado ha n’ime amnwale ha nile, na nsogbu ha nile, na mkpagbu ha nile, ma a bga-ebuli ha elu n’ụbọchị ikpeazụ ahụ.

4 Ma ọ gaghị adị m mma ma asị na i chere na m amatara na onwe m—ọbụghị site na nke arụ kama site na nke mụọ, ọbụghị site n’echiche nke banụ arụ kama site na Chineke.

5 Ugbua, lee, asị m gị, ọbụrụ na aamụghị m rị site na Chineke agaraghị m bamata ihe ndị a nile; mana Chineke site n’ọnụ nke mụọ-ozi ya dị nsọ, emewo ka m mata ihe nile ndị a, ọbụghị site cn’itozu oke ọbụla nke onwe m;

6 N’ihi na agagharịrị m mụ na ụmụ nwoke nke Mosaịa, na-achọ aibibi nzukọ-nsọ nke Chineke ahụ; mana lee, Chineke zitara mụọ-ozi ya dị nsọ ka ọ kwụsị anyị n’ụzọ.

7 Ma lee, ọ gwara anyị okwu, dịka ọ bụ olu nke egbe-elu-igwe, ma ala nile amara jijiji n’okpuru ụkwụ anyị; ma anyị nile dara n’ala, n’ihi na begwu nke Onye-nwe bịakwasịrị anyị.

8 Mana lee, olu ahụ sịrị m: Bilie. Ma ebiliri m ma guzoro ọtọ, ma hụ mụọ-ozi ahụ.

9 Ma ọ sịrị m: Ọbụrụ na ị chọrọ n’onwe gị ka ebibie gị, achọkwala ọzọ ibibi nzukọ-nsọ nke Chineke.

10 Ma o wee ruo na adara m n’ala; ma ọ bụụrụ nʼohere nke mkpụrụ aụbọchị atọ na mkpụrụ abalị atọ ka m na-enweghị ike imeghe ọnụ m, ọbụghị ma m jiri ụkwu na aka m mee ihe ọbụla.

11 Ma mụọ-ozi ahụ gwara m ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ndị nke ụmụnne m nwoke nụrụ, mana anụghị m ha; n’ihi na mgbe m nụrụ okwu nile ahụ—Ọbụrụ na i chọrọ n’onwe gị ka ebibie gị, a chọkwala ọzọ ibibi nzukọ-nsọ nke Chineke—a kụrụ m jiri ụdị oke egwu na ịtụ-n’anya na adịghị ama-ama mgbe ụfọdụ a ga-ebibi m, na m dara n’ala ma anụkwaghị m ihe ọzọ.

12 Mana enyere m oke antaram-ahụhụ ebighi-ebi, n’ihi na mkpụrụ-obi m ka e nyelitere ntaram-ahụhụ nke kachasị elu ma nye ya ahụhụ site na mmehie m nile.

13 E, echetara m mmehie m nile na ajọọ-omume m nile nke e jiri maka ya ana-ata m ahụhụ site nʼihe mgbu nile nke ala-mụọ; e, ahụrụ m na enupụwo m isi megide Chineke m, ma na edebeghị m iwu-nsọ ya nile.

14 E, ma egbuwo m rịị ọtụtụ ụmụ ya, ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ edufuwo m ha duba ha na mbibi; e, na mkpirisi oke nnukwu ka ajọọ-omume m nile dịworo, nke mere na echiche maka ịbata nʼiru Chineke m tara mkpụrụ-obi m nnukwu ahụhụ site na nnukwu egwu n’enweghị nkọwa.

15 O, echere m, na a ga aama m ikpe nchụpụ ma m ghọọ onye n’adịghị kwa ọzọ ma mkpụrụ-obi na arụ, na-agaghị akpọta m igụzọro n’iru Chineke m, ka e kpe m ikpe site bn’ihe nile m mere.

16 Ma ugbua, mkpụrụ ụbọchị atọ na mkpụrụ abalị atọ ka atara m nnukwu ahụhụ, ọbụna jiri mgbu nile nke amkpụrụ-obi a mara ikpe.

17 Ma o wee ruo na mgbe a ka nọrịị na-ata m nnukwu ahụhụ otu a, mgbe e nyere m aahụhụ site na ncheta nke ọtụtụ mmehie m nile, lee, echetakwara m na anụwo m rị ka nna m na-eburu ndị ahụ amụma gbasara ọbịbịa nke otu Jisus Kraịst, otu Ọkpara nke Chineke, ga-achụ aja maka mmehie nile nke ụwa.

18 Ugbua, dịka echiche m jidere uche nke a, etiri m mkpu n’ime obi m: O Jisus, gị Ọkpara nke Chineke, meere m ebere, mu onye nke nọ an’ime ọlụlụ nke ilu, ma agbara m gburu-gburu site na bụdọ-igwe nile nke ọnwụ nke mgbe nile na-adigide.

19 Ma ugbua, lee, mgbe m chere nke a, echetaghị kwa m mgbu m nile ọzọ; e, enyeghị kwa m antaram-ahụhụ site na ncheta nke mmehie m nile ọzọ.

20 Ma o, lee aọn̄ụ, ma lee ìhè ịtụ-n’anya m hụrụ; e, mkpụrụ-obi m jupụtara n’ọn̄ụ nke karịrị akarị dịka mgbu m siri karịa.

21 E, asị m gị, nwa m nwoke, na-agaghị enwe ihe ọbụla nke mabigara mma oke na nke na-elu nnukwu ilu dị ka mgbu m nile siri dị. E, ma ọzọ asị m gị, nwa m nwoke, na n’aka nke ọzọ, agaghị enwe ihe ọbụla mabigara mma oke ma dị ụtọ dịka ọn̄ụ m siri dị.

22 E, echere m na m hụrụ, ọbụna dịka nna anyị aLihaị hụrụ, Chineke nọdụrụ n’oche-eze ya, e jiri igwe ndị mụọ-ozi a napụghị ịgụta ọnụ gbaa ya gburu-gburu, n’ọnọdụ nke ịbụ abụ na ito Chineke ha; e, ma mkpụrụ-obi m chọsịrị ike ino n’ebe ahụ.

23 Mana lee, ụkwụ m na aka m nile natara aike ha ọzọ, ma m guzoro n’ụkwụ m abụọ, ma gosipụta nye ndị ahụ na bamụwo m site na Chineke.

24 E, ma site n’oge ahụ ọbụna wee ruo ugbua, arụwo m ọrụ n’esepụghị aka, ka m wee weta mkpụrụ-obi nile na nchegharị; ka m wee weta ha aidetu ire site n’ọn̄ụ karịrị akarị nke m detụrụ ire; ka e wee mụọ kwa ha site na Chineke, ma ka bemejupụta ha na Mụọ Nsọ.

25 E, ma ugbua lee, O nwa m nwoke, Onye-nwe na-enye m nnukwu ọn̄ụ karịrị akarị nʼime mkpụrụ nke ọrụ m nile.

26 N’ihi na n’ihi aokwu ahụ nke o nyeworo m, lee, amụwo ọtụtụ site na Chineke, ma ha edetụwo ire dịka m detụworo, ma ha ahụwo anya na anya dịka m hụworo; ya mere ha matara maka ihe ndị a nile nke m kwuworo maka ha, dịka m matara; ma na mmụta nke m nwere si na Chineke.

27 Ma a kwadowo m n’oge mnwale nile na nsogbu nile n’ụdị ọbụla, e, ma n’ụdị mkpagbu nile dị iche iche; e, Chineke anapụtawo m site n’ụlọ mkpọrọ, na site n’enweghị onwe nile, na site n’ọnwụ; e, ma etinyere m ntụkwasị obi m nile na ya, ma ọ ka aga-anapụta m.

28 Ma a matara m na ọ aga-ebuli m elu n’ụbọchị ikpe-azụ, ibinyere ya bn’otuto; e, ma a ga m eto ya ruo mgbe nile, n’ihi na ọ ckpọpụtawo nna anyị ha site n’Ijipt, ma o lomiwo dndị Ijipt n’ime Oke Osimiri Uhie; ma o duru ha site n’ike ya baa n’ime ala e kwere na nkwa’, e, ma ọ napụtawo ha site n’ịbụ-oru na ndọkpụ n’agha site n’oge ruo n’oge.

29 E, ma ọ kpọpụtawo kwa nna anyị ha site n’ala nke Jerusalem; ma o sitewo kwa n’ike mgbe nile na-adigide ya, napụta ha site an’ịbụ-oru na ndọkpụ n’agha, site n’oge ruo n’oge ọbụna gbada ruo n’ụbọchị nke ugbua; ma e dotara m na ncheta oge nile ndọkpụ n’agha ha; e, ma gị kwa kwesịrị idota na ncheta, dịka m meworo, ndọkpụ n’agha ha.

30 Mana lee, nwa m nwoke, nke a abụghị ihe nile; n’ihi na I kwesịrị ịmata dịka m siri mata; na aọbụrụra na unu ga-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke, unu ga-eme nke ọma n’ala ahụ; ma Ị kwesịrị ịmata kwa, na ọbụrụra na unu agaghị edebe iwu-nsọ nile nke Chineke a ga-ebepụ unu site n’ebe ọ nọ. Ugbua nke a bụ dịka okwu ya siri dị.