Akwụkwọ nsọ
Alma 25


Isi 25

Ibu agha nile nke ndị Leman wee gbasasịa—Mkpụrụ-afọ nke ndị nchụ-aja nke Noa wee laa n’iyi dịka Abịnadaị siri buo amụma—Ọtụtụ ndị Leman ka a gbanwere ma sonyere ndị nke Antai-Nifaị-Lihaị—Ha kwere na Kraịst ma na-edebe iwu nke Moses. Ihe dịka n’afọ 90 ruo 77 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma lee, ugbua o wee ruo na ndị Leman ahụ were iwe karịa n’ihi na ha egbuwọrịị ụmụnne ha nwoke; ya mere ha n̄ụrụ iyi ịbọ-ụbọ n’arụ ndị Nifaị, ma ha anwaghị kwa a nwa ọzọ igbu ndị nke aAntai-Nifaị-Lihaị n’oge ahụ.

2 Mana ha kpọrọ ndị-agha ha nile ma gafee n’ime oke-ala nile nke ala nke Zarahemla, ma dakwasị ndị ahụ nọ n’ala nke Amọnaịha, ma abibie ha.

3 Ma mgbe nke a gasịrị, ha nwere ọtụtụ agha ha na ndị Nifaị, n’ime nke achụpụrụ ha ma gbuo ha.

4 Ma n’etiti ndị Leman e gburu-egbu ka ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ amkpụrụ-afọ nile nke Amiulọn na ụmụnne ya nwoke, ndị bụ ndị nchụ-aja nke Noa, ma e gburu ha site n’aka nile nke ndị Nifaị;

5 Ma ndị fọdụrụ, ebe ha gbalagara baa n’ime ọwụwa-anyanwụ ọzara ahụ, ma ebe ha pụrụworo ike na ikike n’aka ha n’ebe ndị Leman nọ, mere ka ọtụtụ ndị Leman wee alaa n’iyi site n’ọkụ n’ihi okwukwe ha—

6 N’ihi ọtụtụ n’ime aha, mgbe ha taworo ahụhụ nnukwu ntufụ na ọtụtụ mkpagbu, malitere inwe mkpalite na ncheta nke bokwu nile nke Erọn na ụmụnne ya nwoke kwusaworo ha ozi-ọma n’ala ha; ya mere ha malitere enweghị kwa ntụkwasị obi na comenala nile nke ndị nna ha nile, na ikwere n’Onye-nwe, ma na o nyere ndị Nifaị nnukwu ike; ma otu a enwere ọtụtụ n’ime ha agbanwere n’ime ọzara ahụ.

7 Ma o wee ruo na ndị ọchịchị ahụ nile ndị bụ ndị nke fọdụrụ n’ime ụmụ nke aAmiulọn mere ka e bgbuo ha, e, ndị nile ahụ kwere n’ihe ndị a nile.

8 Ugbua ọgbụgbu ndị nke Kraịst mere na ọtụtụ n’ime ụmụnne ha nwoke ka akpasuru iwe; ma a malitere inwe ndọrọ-ndọrọ n’ime ọzara ahụ; ma ndị Leman malitere aịchụ nta mkpụrụ-afọ nke Amiulọn na ụmụnne ya nwoke ma malite igbu ha; ma ha gbabara n’ime ọzara nke ọwụwa-anyanwụ ahụ.

9 Ma lee a na-achụ nta ha n’ụbọchị taa site na ndị Leman. Otu a okwu nile nke Abịnadaị ka e wetara na mmezu, nke o kwuru gbasara mkpụrụ-afọ nke ndị nchụ-aja nile ndị mere ka ọ taa ahụhụ ọnwụ site n’ọkụ.

10 N’ihi na ọ sịrị ha: Ihe unu aga-eme m ga-abụ ụdị nke ihe nile ga-abịa.

11 Ma ugbua Abịnadaị bụ onye-mbụ nke tara ahụhụ aọnwụ site n’ọkụ n’ihi okwukwe ya na Chineke; ugbua nke a bụ ịhe ọ na-akọwa maka ya, na ọtụtụ ga-ata ahụhụ ọnwụ site n’ọkụ, dịka ọ taworo.

12 Ma ọ sịrị ndị nchụ-aja Noa ahụ nile na mkpụrụ-afọ ha ga-eme ọtụtụ ka e gbuo ha, n’otu ụdị ahụ e gburu ya, ma na ha ga-agbasasị na mba ọzọ ma e gbuo ha, ọbụna dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ a na-achụ ma na-egbu ha site na ajọọ anụ ọhịa nile; ma ugbua lee, okwu ndị a nile ka a chọpụtara, n’ihi na a na-achụ ha site na ndị Leman, ma a chụrụ nta ha, ma a kụgbuo ha.

13 Ma o wee ruo na mgbe ndị Leman hụrụ na ha enweghị ike imeri ndị Nifaị, ha laghachịrị ọzọ n’ala nke aka ha; ma ọtụtụ n’ime ha gafetara ibi n’ala nke Ịshmel na n’ala nke Nifaị, ma jikọta onwe ha na ndị nke Chineke, ndị bụ ndị nke aAntai-Nifaị-Lihaị.

14 Ma ha alịkwara ngwa-ọgụ ha nile nke agha, dịka ụmụnne ha nwoke meworo, ma ha malitere ịbụ ndị ezi-omume; ma ha gara ije n’ụzọ nile nke Onye-nwe, ma ha chetara idebe iwu-nsọ ya nile na usoro-iwu ya nile.

15 E, ma ha debere iwu nke Moses; n’ihi na ọ dị mkpa na ha ga na-edebegodị iwu nke Moses, n’ihi na emezubeghị ha nile. Mana na-agbanyeghị aiwu nke Moses, ha na-ele anya ọbịbịa nke Kraịst, na-atule na iwu nke Moses bụ bụdị nke ọbịbịa Ya, ma na-ekwere na ha ga-edebe cemume nile a na-ahụ anya ruo oge ahụ nke a ga-ekpughe ya nye ha.

16 Ugbua ha echeghị na anzọpụta ga-abịa site bn’iwu nke Moses; kama iwu nke Moses zuru imesi okwukwe ha na Kraịst ike; ma otu a ha jidere colile-anya site n’okwukwe, ruo na nzọpụta ebighi-ebi, na-adabere na Mụọ nke ibu-amụma, nke kwuru maka ihe ndị ahụ nile ga-abia.

17 Ma ugbua lee, Amọn, na Erọn, na Ọmna, na Hịmnaị, na ụmụnne ha ndị nwoke n̄ụrịrị ọn̄ụ karịa, n’ihi ọga n’iru nke ha nwere n’etiti ndị Leman, na-ahụ na Onye-nwe emeworo ha dịka aekpere ha nile siri dị, ma na ọ chọpụtakwara okwu ya nye ha n’ihe nile.