Akwụkwọ nsọ
Alma 58


Isi 58

Hilaman, Gịd, na Tiọmna wee were obodo-ukwu nke Mantaị site n’aghụghọ agha—Ndị nke Leman wee laghachị azụ—Ụmụ nwoke nile nke Amọn e chekwara ha dịka ha siri guzosịe ike na nchekwa nke ntọhapụ na okwukwe ha. Ihe dịka n’afọ 63 ruo 62 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma lee, ugbua o wee ruo na ebum-n’obi nke ọzọ bụ inweta obodo-ukwu nke Mantaị; mana lee, e nweghị ụzọ nke anyị nwere ike iji otu ntakịrị anyị nile ahụ dupụta ha site n’obodo-ukwu ahụ. N’ihi na lee, ha chetara ihe nke anyị meworo; ya mere anyị enweghị ike aịghọgbupụta ha site n’ebe siri ike nile nke ha.

2 Ma ha dịkarịsịrị ọtụtụ n’ọnụ-ọgụgụ karịa ka ndị-agha anyị dịịrị nke mere na anyị anwaghị anwa ịga n’iru ma buso ha agha n’ebe siri ike nile nke ha.

3 E, ma ọ dị mkpa na anyị ga-etinye ndị nwoke anyị n’ichekwa akụkụ ala ndị ahụ nile nke anyị nwetaghachịrị site n’ihe onwunwe anyị nile; ya mere ọ dịịrị mkpa na anyị ga-echere, ka anyị wee nweta ume karịa site n’ala nke Zarahemla na kwa onyinye ọhụrụ nke ihe-oriri.

4 Ma o wee ruo na e zigara m onye-ọchịchị ala anyị onye-ozi, ịkọtụrụ ya gbasara ihe ndị nke anyị na-eme. Ma o wee ruo na anyị chere ịnata ihe-oriri nile na ume site n’ala nke Zarahemla.

5 Mana lee, nke a nyeere anyị aka nanị ntakịrị, n’ihi na ndị Leman nọ kwa na-anata nnukwu ume site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, na kwa ọtụtụ ihe-oriri nile; ma otu a ka ọnọdụ anyị nile n’oge nke a siri dị.

6 Ma ndị Leman na-aba anyị ọgụ site n’oge ruo n’oge, na-ekpebi site n’aghụghọ ibibi anyị; otu o sila dị anyị enweghị ike ịlụso ha ọgụ, n’ihi nlaghachị-azụ ha nile na ebe siri ike ha nile.

7 Ma o wee ruo na anyị cheere n’ọnọdụ ndị a nile siri ike ruo ọtụtụ ọnwa, ọbụna ruo mgbe ọfọdụrụ ntakịrị ka anyị laa n’iyi n’ihi ụkọ nri.

8 Mana o wee ruo na anyị natara nri, nke e chekwara butara anyị site n’aka ndị-agha nke ndị nwoke dị puku abụọ inyere anyị aka; ma nke a bụ enyem-aka nile nke anyị natara, iji chekwaa onwe anyị na mba anyị site n’ịdaba n’aka nke ndị-iro anyị, e, ịlụ-ọgụ anyị na onye-iro ọnụ na-apụghị ịgụta.

9 Ma ugbua ihe kpatara mgbagwọju-anya anyị nile ndị a, ma-ọbụ ihe mere ha ezitaraghị anyị ume ọzọ, anyị amataghị; ya mere o wutere anyị ma mejupụta kwa anyị n’egwu, eleghị-anya n’ụzọ ọbụla ikpe nile nke Chineke ga-abịakwasị ala anyị, na-nkwatu anyị na mbibi anyị kpam kpam.

10 Ya mere anyị wụpụtara mkpụrụ-obi anyị nile n’ekpere nye Chineke, ka ọ gbaa anyị ume ma napụta anyị site n’aka nke ndị-iro anyị, e, na kwa nye anyị ume ka anyị wee nwe ike idebe obodo-ukwu anyị nile na ala anyị nile, na ihe onwunwe anyị nile, maka nkwado nke ndị nke anyị.

11 E, ma o wee ruo na Onye-nwe Chineke anyị letara anyị jiri ikwe-nkwa nile na ya ga-anapụta anyị; e, nke mere na o kwuru udo nye mkpụrụ-obi anyị nile, ma nye kwa anyị nnukwu okwukwe, ma mee kwa ka anyị nwee olile-anya maka nnapụta anyị n’ime ya.

12 Ma anyị nwere mgbamume anyị na ndị-agha ntakịrị anyị nke anyị nwetaworo, ma ha nwere mkpebi siri ike imeri ndị-iro anyị nile, na aichekwa ala anyị nile, na ihe onwunwe anyị nile, na ndị nwunye anyị, na ụmụ anyị, na ihe gbasara bntọhapụ anyị.

13 Ma otu a ka anyị siri gaa n’iru jiri ike anyị nile megide ndị Leman, ndị nke nọ n’obodo-ukwu nke Mantaị; ma anyị rụnyere ụlọ ikwuu anyị nile n’akụkụ ọzara ahụ, nke dị nso n’obodo-ukwu ahụ.

14 Ma o wee ruo na n’echi ya, na mgbe ndị Leman hụrụ na anyị nọ n’oke-ala nile n’akụkụ ọzara ahụ nke dị nso n’obodo-ukwu ahụ, na ha zipụrụ ndị onyota-ọgba-ama ha nile gburu-gburu anyị ka ha wee chọpụta ọnụ-ọgụgụ na ume nke ndị-agha anyị.

15 Ma o wee ruo na mgbe ha hụrụ na anyị esighị ike, dịka ọnụ-ọgụgụ anyị nile siri dị, ma na-atụ egwu na anyị ga-agbabichiri ha ebe nkwado ha si na-abịa ma ọbụghị na ha ga-apụta bịa ọgụ megide anyị ma gbuo anyị, na kwa iche na ọ ga-adịrị ha mfe ibibi anyị jiri ọtụtụ imerime ọnụ-ọgụgụ ha nile, ya mere ha malitere ime njikere nile ịpụta megide anyị n’ịlụ-agha.

16 Ma mgbe anyị hụrụ na ha na-eme njikere ịpụta megide anyị, lee, e mere m ka Gịd, jiri ntakịrị ọnụ-ọgụgụ nke ndị nwoke, zoo onwe ha n’ime ọzara ahụ, na kwa na Tiọmna na ọnụ-ọgụgụ ntakịrị nke ndị nwoke ga ezo kwa onwe ha n’ime ọzara ahụ.

17 Ugbua Gịd na ndị nwoke ya nọ n’aka nri ma ndị ọzọ ahụ n’aka ekpe; ma mgbe ha sịworo otu a zoo onwe ha, lee, a nọgidere m, mụ na ndị fodụrụ n’ime ndị-agha m, n’otu ebe ahụ nke anyị rụnyeworo ụlọ ikwuu anyị nile maka oge nke ndị Leman ga-abịa ịlụ-agha.

18 Ma o wee ruo na ndị Leman pụtara ha na imerime ọnụ-ọgụgụ ndị-agha ha imegide anyị. Ma mgbe ha bịaworo ma ọ fọdụrụ ntakịrị ka ha dakwasị anyị ha na mma-agha ha, e mere m ka ndị nwoke m, ndị nke mụ na ha nọ, ka ha laghachi-azụ n’ime ọzara ahụ.

19 Ma o wee ruo na ndị Leman soro anyị n’azụ jiri nnukwu ọsọ, n’ihi na ha chọsịrị-ike karịa ịchụfe anyị ka ha wee gbuo anyị; ya mere ha soro anyị baa n’ime ọzara ahụ; ma anyị gafere n’etiti Gịd na Tiọmna, nke mere na ndị Leman achọtaghị ha.

20 Ma o wee ruo na mgbe ndị Leman gafeworo, ma-ọbụ mgbe ndị-agha ahụ gafeworo, Gịd na Tiọmna bilitere site n’ebe nzuzo ha nile, ma gbabichie ndị onyota-ọgba-ama nile nke ndị Leman ka ha ghara ịlaghachị n’obodo-ukwu ahụ.

21 Ma o wee ruo na mgbe ha gbabichiworo ha, ha gbagara n’obodo-ukwu ahụ ma dakwasị ndị-nche ahụ nile a hapụrụ iche obodo-ukwu ahụ nche, nke mere na ha bibiri ha ma were onwunwe nke obodo-ukwu ahụ.

22 Ugbua nke a ka e mere n’ihi na ndị Leman kwere ka ndị-agha ha nile, ma ọbụghị ndị-nche ole na ole nanị, ka a ga-edupụ baa n’ime ọzara ahụ.

23 Ma o wee ruo na Gịd na Tiọmna site n’ụzọ nke a enwetawo onwunwe nke ebe siri ike ha nile. Ma o wee ruo na anyị chọọrọ ụzọ anyị, mgbe anyị gachara nnukwu njem n’ime ọzara chee iru n’ala nke Zarahemla.

24 Ma mgbe ndị Leman hụrụ na ha na azọ-ije chee iru n’ala nke Zarahemla, egwu tụrụ ha karịa, eleghị-anya e nwere atụmatụ e debere iduba ha na mbibi, ya mere ha malitere ịlaghachi n’ime ọzara ahụ ọzọ, e, ọbụna laghachị-azụ site n’otu ụzọ ahụ nke ha siri bịa.

25 Ma lee, ọ bụ abalị ma ha rụnyere ụlọ ikwuu ha nile, n’ihi na ndị-isi ọchị-agha nile nke ndị Leman echewo na ike gwụrụ ndị Nifaị n’ihi ịzọ-ije ha; ma na eche na ha achuwo ndị-agha ha nile ya mere ha echeghị echiche banyere obodo-ukwu nke Mantaị ahụ.

26 Ugbua o wee ruo na mgbe o ruru abalị, e mere m ka ndịkom mụ ghara ịrahụ ụra, kama na ha ga-azọ-ije gaa n’iru site n’ụzọ ọzọ chee iru n’ala nke Mantaị ahụ.

27 Ma n’ihi ịzọ-ije anyị nke a n’oge abalị, lee, n’echi ya anyị nọ n’iru ndị Leman, nke mere na anyị buru ha ụzọ rute n’obodo-ukwu nke Mantaị.

28 Ma otu a o wee ruo, na site n’aghụghọ agha nke a anyị weere onwunwe nke obodo-ukwu nke Mantaị na-enweghị nkwafu ọbara.

29 Ma o wee ruo na mgbe ndị-agha nile nke ndị Leman rutere nso obodo-ukwu ahụ, ma hụ na anyị nọ na njikere izute ha, ọ tụrụ ha n’anya karịa ma yie ha egwu, nke mere na ha gbabara n’ime ọzara ahụ.

30 E, ma o wee ruo na ndị-agha nile nke ndị Leman gbapụrụ site n’akụkụ nile nke ala ahụ. Mana lee, ha eburuwo ọtụtụ ndịnyom na ụmụ-ntakịrị pụọ site n’ala nke ahụ.

31 Ma aobodo-ukwu nile ndị ahụ ndị Leman wereworo, ha nile nọ n’oge mgbe nke a n’onwunwe nke anyị; ma ndị nna anyị nile na ndịnyom anyị na ụmụ anyị na-alaghachị n’ụlọ ha nile, ha nile ma ọbụghị ndị ahụ a kpọrọworo ka ndị-mkpọrọ ma ndị Leman ebupụ ha.

32 Mana lee, ndị-agha anyị nile dị ntakịrị n’ichekwa oke nnukwu ọnụ-ọgụgụ nke obodo-ukwu nile na oke nnukwu ihe onwunwe nile.

33 Mana lee, anyị tụkwasịrị obi na Chineke anyị onye nyeworo anyị mmeri n’ala ndị ahụ nile, nke mere na anyị enwetawo obodo-ukwu nile ndị ahụ na ala nile ndị ahụ, bụ ndị nke anyị.

34 Ugbua anyị amataghị ihe kpatara na ndị-ọchịchị anaghị ezitakwara anyị ume ọzọ; ọbụghị ma ndị nwoke ahụ bịakwutere anyị ha matara ihe mere anyị enwetabeghị ume karịrị nke a.

35 Lee, anyị amataghị kama na unu emerighị, ma unu akpụrụwo ndị-agha nile pụọ n’ime akụkụ ala ebe ahụ; ọ bụrụ otu ahụ, anyị achọghị ịtamu.

36 Ma ọ buru na ọdịghị otu ahụ, lee, egwu na-atụ anyị na e nwere ankewa na ndị-ọchịchị ahụ, mere na ha anaghị ezitakwara anyị ndị nwoke ọzọ inyere anyị aka; n’ihi na anyị matara na ha dị imerime n’ọnụ-ọgụgụ karịa nke ahụ ha zitaworo.

37 Mana, lee, ọ dịghị ihe o mere—anyị tụkwasịrị-obi na Chineke aga-anapụta anyị, na-agbanyeghị adịghị-ike nke ndị-agha anyị nile, e, ma napụta anyị site n’aka nile nke ndị-iro anyị.

38 Lee, nke a bụ afọ nke iri abụọ na iteghete, na nso ngwụcha, ma anyị nọ na njide onwunwe nke ala anyị nile; ma ndị Leman agbagawo n’ala nke Nifaị.

39 Ma ụmụ-nwoke nile nke ndị nke Amọn, ndị nke m toworo otuto di ukwu maka ha, mụ na ha nọ n’obodo-ukwu nke Mantaị; ma Onye-nwe akwadowo ha, e, ma debe ha ka ha ghara ịda site na mma-agha, nke mere na ọbụna aotu mkpụrụ-obi e gbụghị ya.

40 Mana lee, ha anatawo ọtụtụ mmerụ-arụ; na-agbanyeghị ha guzosịrị ike na antọhapụ ahụ n’ebe nke Chineke meworo ka ha nwere onwe ha; ma ha siri ike n’icheta Onye-nwe Chineke ha site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị; e, ha na-elezi-anya idebe usoro-iwu ya nile, na ikpe ya nile, na iwu-nsọ ya nile esepụghị-aka; ma okwukwe ha siri ike n’amụma nile ahụ gbasara ihe ahụ nke ga-abịa.

41 Ma ugbua, nwanne m nwoke m hụrụ n’anya, Moronaị, ka Onye-nwe Chineke anyị, onye gbapụtaworo anyị ma mee ka anyị nwere onwe anyị, debe gị esepụghị-aka n’iru ya; e, ma ka ọ gọzie ndị nke a, ọbụna ka unu nwe mmeri n’inweta onwunwe ihe nile nke ndị Leman naraworo anyị, nke bụ maka nkwado anyị. Ma ugbua, lee, emechie m akwụkwọ-ozi m. Abụ m Hilaman, nwa nwoke nke Alma.