Akwụkwọ nsọ
Alma 18


Isi 18

Eze Lamonaị wee chee na Amọn bụ Nnukwu Mụọ ahụ—Amọn wee kuziere eze ahụ maka Okike, maka mmekọrịta nile nke Chineke na ndị mmadụ, na maka mgbapụta ahụ nke na-abịa site na Kraịst—Lamonaị wee kwere ma daa n’ala dịka ọ nwụwo. Ihe dịka n’afọ 90 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na eze Lamonaị mere ka ụmụ-oru ya nile guzoro ma gbaa ama maka ihe nile nke ha hụworo gbasara ihe ahụ.

2 Ma mgbe ha nile gbaworo ama maka ihe nile ndị ha hụworo, ma ọ mụtaworiị maka ikwesị-ntụkwasị-obi nke Amọn n’ichekwa igwe-atụrụ ya nile, na kwa maka nnukwu ike ya n’ịlụ ọgụ megide ndị ahụ chọrọ igbu ya, ọ tụrụ ya n’anya karịa, ma sị: N’ezie, nke a karịrị otu nwoke. Lee, nke a ọbụghị Nnukwu Mụọ onye na-ezite ụdị nnukwu ntaram-ahụhụ nile n’arụ ndị a, n’ihi igbu mmadụ ha nile?

3 Ma ha zara eze ahụ, ma sị: Ma ọ bụ Nnukwu Mụọ ahụ ma-ọbụ otu nwoke, anyị amaghị; ma na nke ha otu a ka anyị matara, na ndị-iro nile nke eze ahụ nile aenweghị ike igbu ya; ọbụghị ma ha nwere ike ịchụsasị igwe-atụrụ nile nke eze ahụ mgbe ọ na-anọnyere anyị, n’ihi ọkachamara na nnukwu ume ya; ya mere, anyị matara na ọ bụ enyi nke eze ahụ. Ma ugbua, O eze, anyị ekweghị na otu nwoke nwere nnukwu ike ha otu a, n’ihi na anyị matara na enweghị ike igbu ya.

4 Ma ugbua, mgbe eze nụrụ okwu ndị a nile, ọ sịrị ha: Ugbua a matara m na ọ bụ Nnukwu Mụọ ahụ; ma ọ rịdatawo n’oge nke a ichekwa ndụ unu nile, ka m wee ghara aigbu unu dịka m mere ụmụnne unu nwoke. Ugbua nke a bụ Nnukwu Mụọ ahụ nke nna anyị ha kwuworo maka ya.

5 Ugbua nke a bụ omenala nke Lamonaị, nke ọ nataworo site n’aka nna ya, na enwere otu aNnukwu Mụọ. Na-agbanyeghị ha kwere na otu Nnukwu Mụọ, ha chere na ihe ọbụla ha mere dị mma; otu o sila dị, Lamonaị malitere ịtụ-egwu karịa, jiri egwu na eleghị anya o mewọrị ihe ọjọọ n’igbu ụmụ-oru ya.

6 N’ihi na o gbuworịị ọtụtụ n’ime ha n’ihi na ụmụnne ha nwoke achụsasịwọ igwe-atụrụ ha nile n’ebe ahụ mmiri dị; ma otu a, n’ihi na ha a chụsasịwọ igwe-atụrụ ha nile e gburu ha.

7 Ugbua ọ bụ ihe ndị Leman a na-eme iguzoro n’akụkụ mmiri nile nke Sibọs ịchụsasị igwe-atụrụ nile nke ndị ahụ, na site n’ebe ahụ ha ga-achịrị ọtụtụ ndị achụsasịworo baa n’ala nke ha, ebe ọ bụ ihe ha na-eme nke mpụnara dị n’etiti ha.

8 Ma o wee ruo na eze Lamonaị jụrụ ụmụ-oru ya nile, na-asị: Olee ebe nwoke ahụ nke nwere Ụdị nnukwu ike ahụ nọ?

9 Ma ha sịrị ya: Lee, ọ na-enye ịnyịnya gị nile nri. Ugbua eze ahụ enyewọrịị ụmụ-oru ya nile iwu, tutu o ruo oge inye igwe-atụrụ ha mmiri, ka ha wee kwado ịnyịnya ya nile na ụgbọ-ala ya nile, ma duga ya n’ala nke Nifaị; n’ihi na enwewọrịị nnukwu oriri eyiri n’ala nke Nifaị, site n’aka nna Lamonaị, onye bụ eze n’ala ahụ nile.

10 Ugbua mgbe eze Lamonaị nụrụ na Amọn na-akwado ịnyịnya ya nile na ụgbọ-ala ya nile ọ tụrụ ya n’anya karịa, n’ihi ikwesi-ntụkwasị-obi nke Amọn, na-asị: N’ezie enwebeghị nwa-oru ọbụla n’etiti ụmụ-oru m nile nke dịrịla ikwesi ntụkwasị obi dịka nwoke nke a; n’ihi na ọbụna ọ na-echeta iwu m nile na-edebe ha.

11 Ugbua a matara m n’ezie na nke a bụ Nnukwu Mụọ ahụ, ma a ga m achọ ya ka ọ batakwute m, mana a nwaghị m anwa.

12 Ma o wee ruo na mgbe Amọn jikeworo ịnyịnya nile ahụ na ụgbọ-ala nye eze ahụ na ụmụ-oru ya nile, ọ bakwugara eze ahụ, ma ọ hụrụ na mbara iru nke eze ahụ gbanwere; ya mere ọ chọrọ ịlaghachi si n’iru ya pụọ.

13 Ma otu n’ime ụmụ-oru eze ahụ sịrị ya, Rabbana, nke bụ ma asụgharịa ya, o si-ike ma-ọbụ nnukwu eze, ebe ha na-ewere ndị eze ha nile ịbụ ndị siri ike; ma otu a ọ sịrị ya: Rabbana, eze ahụ chọrọ ka ịnọdụ.

14 Ya mere Amọn tụgharịrị onwe ya n’ebe eze ahụ nọ, ma sị ya: Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị, O eze? Ma eze ahụ azaghị ya ruo ohere nke otu awa, dịka oge nke ha, n’ihi na ọ maghị ihe ọ ga-agwa ya.

15 Ma o wee ruo na Amọn sị kwara ya ọzọ: Gịnị ka ị chọrọ n’aka m? Mana eze ahụ azaghị ya.

16 Ma o wee ruo na Amọn, ebe o jupụtara na Mụọ nke Chineke, ya mere ọ matara aechiche nile nke eze ahụ. Ma ọ sịrị ya: Ọ bụ n’ihi na Ị nụwo na m chekwara ụmụ-oru gị na igwe-atụrụ gị nile, ma gbuo ụmụnne ha nwoke asaa jiri ébè na jiri mma agha, ma bepụ aka ndị nke ọzọ nile, ka m wee chekwa igwe-atụrụ gị nile na ụmụ-oru gị; lee, ọ bụ nke a kpatara oke ịtụ-n’anya gị nile?

17 Asị m gị, ọbụ gịnị, ka oke ịtụ-n’anya gị jiri dị ukwuu otu a? Lee, abụ m nwoke, ma abụ m nwa-oru gị; ya mere, ihe ọbụla Ị chọrọ nke dị mma, nke ahụ ka m ga-eme.

18 Ugbua mgbe eze ahụ nụworo okwu ndị a nile, ọ tụrụ ya n’anya ọzọ, n’ihi na ọ hụrụ na Amọn nwere ike aịgụta echiche ya nile; mana na-agbanyeghị nke a, eze Lamonaị meghepụrụ ọnụ ya, ma sị ya: Onye ka Ị bụ? Ọbụ gị bụ Nnukwu Mụọ ahụ, onye bmazuru ihe nile?

19 Amọn zara ma sị ya: Abụghị m ya.

20 Ma eze ahụ sịrị: Olee otu i siri mata echiche nile nke obi m? I nwere ike ikwu n’enweghị egwu, ma gwa m gbasara ihe ndị a nile; na kwa gwa m site n’ike gịnị ka I gburu ma bepụ aka nile nke ụmụnne m nwoke ndị chụsasịrị igwe-atụrụ m nile—

21 Ma ugbua, ọbụrụ na ị ga-agwa m gbasara ihe ndị a nile, ihe ọbụla ị chọrọ a ga m enye gị; ma ọbụrụ na a chọrọ, a ga m eche gị jiri ndị-agha m nile; mana a matara m na I siri ike karịa ha nile; otu o sila dị, ihe ọbụla Ị chọrọ n’aka m a ga m enye gị ya.

22 Ugbua Amọn ebe ọ ma ihe, ma na ọdịghị eme mmadụ ihe ọjọọ, ọ sịrị Lamonaị: Ị ga-an̄a ntị n’okwu m nile, ọbụrụ na m gwa gị site n’ike gịnị m mere ihe ndị a nile? Ma nke a bụ ihe m chọrọ n’aka gị.

23 Ma eze ahụ zara ya, ma sị: E, aga m e kwere okwu gị nile. Ma otu a ejidere ya site n’aghụghọ.

24 Ma Amọn malitere ịgwa ya okwu an’enweghị egwu, ma sị ya: I kwere na e nwere otu Chineke?

25 Ma ọ zara, ma sị ya: Amataghị m ihe nke ahụ pụtara.

26 Ma mgbe ahụ Amọn sịrị: Ikwere na e nwere otu Nnukwu Mụọ?

27 Ma ọ siri, E.

28 Ma Amọn sịrị: Nke a bụ Chineke. Ma Amọn sịrị ya ọzọ: I kwere na Nnukwu Mụọ a, onye bụ Chineke, kere ihe nile ndị dị n’elu-igwe na n’elu ụwa?

29 Ma ọ sịrị: E, kwere m na o kere ihe nile dị n’ụwa; mana a mataghị m maka elu-igwe nile.

30 Ma Amọn sịrị ya: Elu-igwe nile bụ ebe nke Chineke bị na ndị mụọ-ozi ya nile dị nsọ.

31 Ma eze Lamonaị sịrị: Ọ dị elu karịa ụwa?

32 Ma Amọn sịrị: E, ma ọ na-eleda anya lekwasị ụmụ nke mmadụ nile; ma ọ mazuru aechiche nile na nzube nile nke obi; n’ihi na site n’aka ya ka ekere ha nile site na mmalite ahụ.

33 Ma eze Lamonaị sịrị: E kwere m ihe nile ndị a nke I kwuworo. Ezitara gị site n’ebe Chineke nọ?

34 Amọn wee sị ya: Abụ m nwoke; ma ammadụ na mmalite ka e kere n’ụdị oyiyi nke Chineke, ma a kpọrọ m site na Mụọ Nsọ bikuziri ndị a ihe ndị a nile, ka e wee weta ha n’ọmụma nke ihe ahụ nke zịrị ezi na ezi-okwu;

35 Ma ụfọdụ nke aMụọ ahụ bi n’ime m, nke na-enye m bmmụta, na kwa ike dịka okwukwe m na ọchịchọ m nile nke dị n’ime Chineke siri dị.

36 Ugbua mgbe Amọn kwuworo okwu ndị a, ọ malitere na okike nke ụwa, na kwa n’okike nke Adam, ma gwa ya ihe nile gbasara ọdịda nke mmadụ, ma akwugharịa ma tọgbọ n’iru ya akụkọ-ndekọta nile na bakwụkwọ-nsọ nile nke ndị ahụ, nke cndị-amụma nile kwuworo, ọbụna gbada ruo n’oge nke nna ha, Lihaị, hapụrụ Jerusalem.

37 Ma o kwugharịkwara nye ha (n’ihi na ọ bụ nye eze ahụ na nye ụmụ-oru ya nile) njem nile nke ndị nna ha n’ime ọzara ahụ, na ntaram-ahụhụ ha nile site n’agụụ na akpịrị ịkpọ nku, na ịrusi oru ike ha, na ihe ndị ọzọ.

38 Ma o kwugharịkwara nye ha gbasara nnupụ-isi nile nke Leman na Lemuel, na ụmụ nwoke nile nke Ịshmel, e, nnupụ-isi ha nile ka ọ kọọrọ ha; ma ọ kọwadaruru ha ala akụkọ-ndekọta nile na akwụkwọ-nsọ nile site n’oge ahụ nke Lihaị hapụru Jerusalem gbada ruo oge ugbua.

39 Mana nke a abụghị ihe nile; n’ihi na ọ kọwadaruru ha ala aatụmatụ nke mgbapụta, nke a kwadoro site na ntọ-ala nke ụwa; ma o mekwara ka ha mata gbasara ọbịbịa nke Kraịst, na ọrụ nile nke Onye-nwe ka o mere ka ha mata.

40 Ma o wee ruo na mgbe o kwusịworo ihe ndị a nile, ma kọwadaruo ha ala nye eze ahụ, na eze ahụ kwere okwu ya nile.

41 Ma ọ malitere itiku Onye-nwe, na-asị: O Onye-nwe, mee ebere; dịka uju aebere gị nke I meworo ndị nke Nifaị siri dị, meere m, na ndị m.

42 Ma ugbua, mgbe o kwuworo nke a, ọ dara n’ala, dịka ọ nwụrụ anwụ.

43 Ma o wee ruo na ụmụ-oru ya kpọọrọ ya ma bubara ya nwunye ya, ma dínaa ya n’elu akwa-ụra; ma o dịnara dịka ọ nwụrụ anwụ ruo ụbọchị abụọ na abalị abụọ; ma nwunye ya, na ụmụ ya nwoke, na ụmụ-ada ya ruuru ya uju, n’ụdị usoro nke ndị Leman, na-akwa akwa-arịrị maka ofufu ya.