Akwụkwọ nsọ
Alma 1


Akwụkwọ nke Alma
Nwa nke Alma

Nkọwasị nke Alma, onye bụ nwa nwoke nke Alma, onye mbụ na onye-isi-ikpe nye ndị nke Nifaị, na kwa onye isi nchụ-aja nye Nzukọ-nsọ ahụ. Nkọwasị nke ọchịchị nke ndị-ikpe, na agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile n’etiti ndị ahụ. Na kwa nkọwasị nke agha n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman, dịka akụkọ-ndekọta nke Alma, onye mbụ na onye-isi-ikpe siri dị.

Isi 1

Nihọ wee kuzie ozizi ụgha nile, wee hiwe otu nzukọ, wee webata nchụ-aja aghụghọ, ma wee gbuo Gịdiọn—Nihọ ka e gburu n’ihi mmebi iwu ya nile—Nchụ-aja aghụghọ na mkpagbu nile wee gbasasịa n’etiti ndị ahụ—Ndị nchụ-aja wee kwado onwe ha, ndị ahụ wee lekọta ndị ogbenye, ma Nzukọ-Nsọ ahụ wee mee nke ọma. Ihe dịka n’afo 91 ruo 88 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua o wee ruo na n’afọ mbụ nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile nye ndị nke Nifaị, site n’oge a gaa n’iru, eze Mosaịa ebe ọ agaworo n’ụzọ nke ụwa nile, ebe ọ lụworo ezigbo agha, na-eje ije zịrị-ezi n’iru Chineke, na-ahapụghị onye ọbụla ka ọ chịa n’ọnọdụ ya; otu o sila dị o hiwere biwu nile, ma ndị ahụ nakwere ha, ya mere ọ bụụrụ ihe ha na-aghaghị ime bụ idebe iwu nile nke o meworo.

2 Ma o wee ruo na n’ime afọ mbụ nke ọchịchị nke Alma n’ime oche-ikpe ahụ, o nwere aotu nwoke a kpọtara n’iru ya ka e kpee ya ikpe, otu nwoke buru ibu, ma a ma ya ama maka nnukwu inwe ume.

3 Ma ọ gagharịworịị n’etiti ndị ahụ, na-ekwu ozi-ọma nye ha ihe nke o aweere ka ọ bụrụ okwu nke Chineke, na-eme omume mweda bmegide nzukọ-nsọ ahụ; na-ekwupụta nye ndị ahụ na onye nchụ-aja ọbụla na onye nkuzi ckwesịrị ịghọ onye a ma ama; na ha dekwesịghị ịrụ ọrụ n’aka ha, kama ha kwesịrị inwe nkwado nke ndị ahụ.

4 Ma ọ gbakwara ama nye ndị ahụ na mmadụ nile ga-enwe nzọpụta n’ụbọchị ikpe-azụ, ma na ha ekwesịghị ịtụ egwu ma-ọbụ ma jijiji, kama na ha ga-ewelite isi ha nile elu ma n̄ụrịa, n’ihi na Onye-nwe e kewọ mmadụ nile, ma gbapụtawo kwa mmadụ nile; ma, n’ikpeazụ, mmadụ nile ga-enwe ndụ-ebighi-ebi.

5 Ma o wee ruo na ọ kuziri ihe ndị a nke ukwuu nke mere na ọtụtụ kwenyere n’okwu ya nile, ọbụna ọtụtụ nke mere na ha malitere na-akwado ya ma nye ya ego.

6 Ma ọ malitere inwe mbụli-elu n’ime mpako nke obi ya, na iyi uwe oke-ọnụ-ahịa, e, na ọbụna ọ malitere ihiwe otu anzukọ n’ụdị nke ikwusa ozi-ọma ya.

7 Ma o wee ruo ka ọ na-aga, ikwu ozi-ọma nye ndị kwenyere n’okwu ya, o zutere otu nwoke bụ onye nke nzukọ-nsọ nke Chineke, e, ọbụna otu n’ime ndị nkuzi ha, ma o wee malite ịdọso ya ndọrọ-ndọrọ ọnụ nkọ, ka o wee dufuo ndị nke nzukọ-nsọ ahụ; ma na nwoke ahụ guzogidere ya, na-adọ ya aka na ntị site an’okwu nke Chineke.

8 Ugbua aha nwoke ahụ bụ aGịdiọn; ma-ọbụ ya bụ onye bụ ngwa-ọrụ n’aka nile nke Chineke n’ịnapụta ndị nke Lịmhaị site n’ịbụ-oru.

9 Ugbua, n’ihi na Gịdiọn guzogidere ya n’okwu nile nke Chineke o wesara Gịdiọn oke iwe, ma sere mma agha ya ma malite ịku ya ihe. Ugbua Gịdiọn ebe ọ gbaworo ọtụtụ afọ, ya mere o nweghị ike ịnagide ọkụkụ ihe ya nile, ya mere e agburu ya site na mma agha ahụ.

10 Ma nwoke ahụ nke gburu ya ka ndị nzukọ-nsọ ahụ kpọọrọ, ma a kpọtara ya n’iru Alma, ka e akpee ya ikpe dịka mmebi iwu nile nke o mebiworo siri dị.

11 Ma o wee ruo na o guzoro n’iru Alma ma rịọ maka onwe ya jiri nnukwu atụghị egwu.

12 Ma na Alma sịrị ya: Lee, nke a bụ oge mbụ nke a na-ewebata anchụ-aja aghụghọ n’etiti ndị a. Ma lee, ikpe amaghị gị nanị maka nchụ-aja aghụghọ, kama ịgbawo mbọ ịmanye ya site na mma agha; ma ọ bụrụ na enwere ike imanye nchụ-aja aghụghọ n’etiti ndị a ọ ga-apụta mbibi ha kpam kpam.

13 Ma ị kwafuwo ọbara nke onye ezi-omume, e, nwoke nke meworo nnukwu ihe ọma n’etiti ndị a; ma asị na anyị debe gị ọbara ya ga-abịakwasị anyị maka aibọ-ọbọ.

14 Ya mere a mawo gị ikpe ọnwụ, dịka iwu e nyeworo anyị site n’aka Mosaịa, onye-eze ikpe-azụ anyị siri dị; ma ndị a anakwerewo ya; ya mere ndị a aga-anọgiderịrị n’iwu ahụ.

15 Ma o wee ruo na ha kpọọrọ ya; ma aha ya bụ aNihọ; ma ha bugoro ya n’elu elu nke ugwu-nta Mantaị, ma n’ebe ahụ a manyere ya, ma-ọbụ ọ nakweere, n’etiti elu-igwe nile na ụwa, na ihe ọ kụziiri ndị ahụ megidere okwu nke Chineke; ma n’ebe ahụ ọ tara ahụhụ bọnwụ ihere.

16 Otu o sila dị, nke a ewetaghị n’isi njedebe mgbasa nke nchụ-aja aghụghọ n’ala ahụ nile; n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị hụrụ ihe efu nile nke ụwa n’anya, ma ha gara n’iru na-ekwusa ozizi ụgha nile; ma nke a ka ha mere n’ihi inweta aụba nile na nkwanye ugwu.

17 Otu o sila dị, ha anwaghị anwa aikwu okwu ụgha, ọbụrụ na a matara ya, n’ịtụ egwu nke iwu ahụ, n’ihi na ndị okwu ụgha nile ka e nyere ntaram-ahụhụ; ya mere ha mere dịka ha na-ekwusa ozi-ọma n’ụdị ha kwenyere; ma ugbua iwu ahụ agaghị enwe ike n’arụ onye ọbụla nʼihi bokwukwe ya.

18 Ma ha anwaghị anwa aizu ori, nʼihi ịtụ egwụ nke iwu ahụ, nʼihi na ụdị ahụ nwere ntaram-ahụhụ, ọbụghị ma ha nwara anwa ịpụnara mmadụ ihe, ma-ọbụ igbu mmadụ, n’ihi na onye ọbụla nke bgburu mmadụ ka e nyere ntaram-ahụhụ ruo cọnwụ.

19 Ma na o wee ruo na onye ọbụla na-abụghị nke nzukọ-nsọ nke Chineke malitere ịkpagbu ndị nke nọ n’otu nzukọ-nsọ nke Chineke, ma bukwasịwọrịị onwe ha aha nke Kraịst.

20 E, ha sogburu ha, ma kpagbuo n’ụdị okwu nile dị iche iche ma nke a n’ihi ịdị umeala ha; n’ihi na ha enweghị mpako n’anya nke onwe ha, na n’ihi na ha kuziri okwu Chineke, otu na ibe ya, na-ejighi aego na ahụghị ọnụ ahịa.

21 Ugbua e nwere iwu siri ike n’etiti ndị nke nzukọ-nsọ ahụ, na agaghị enwe onye ọbụla, bụ nke nzukọ-nsọ ahụ, ga-ebili ma akpagbuo ndị nke na-abụghị nke nzukọ-nsọ ahụ, ma na agaghị enwe mkpagbu n’etiti onwe ha.

22 Otu o sila dị, e nwere ọtụtụ n’etiti ha ndị malitere inwe mpako, ma malite ịdọ ndọrọ ndọrọ dị ọkụ ha na ndị iro ha nile, ọbụna ruo n’ịkụ ọkpọ; e, ha ga-akụ otu na ibe ya jiri aka-ọkpọ ha nile.

23 Ugbua nke a bụ n’ime afọ nke abụọ nke ọchịchị nke Alma, ma-ọbụ ihe kpatara nnukwu nsogbu nye nzukọ-nsọ ahụ; e, ọ bụ ihe kpatara nnukwu ọnwụnwa nye nzukọ-nsọ ahụ.

24 N’ihi na obi nke ọtụtụ ka e mesịrị ike, ma aha ha nile ka aehichapụrụ, na echetaghị ha ọzọ n’etiti ndị nke Chineke. Na kwa ọtụtụ bsepụrụ onwe ha site n’etiti ha.

25 Ugbua nke a bụụrụ nnukwu ọnwụnwa nye ndị nke guzosiri ike n’okwukwe ahụ; otu o sila dị, ha bụ ndị kwụsịrị ike na akwa akwụrụ n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma ha buru ya jiri andidi buo mkpagbu ahụ nke a kwakọtara n’elu ha.

26 Ma mgbe ndị nchụ-aja nile hapụrụ aọrụ ha ikuzi okwu nke Chineke nye ndị ahụ, ndị ahụ hapụkwara ọrụ ha nile ịnụrụ okwu nke Chineke. Ma mgbe onye nchụ-aja kụziwooro ha okwu nke Chineke ha nile laghachịrị ọzọ na mgbalị n’ọrụ ha nile; ma onye nchụ-aja ahụ, n’ebulighị onwe ya elu karịa ndị na-ege ya ntị, n’ihi na onye-nkwusa okwu akaghị onye na-anụ anụ mma, ọbụghị ma onye-nkuzi ọ ka onye-na-amụ amụ mma, ma otu a ha nile ha n’otu, ma ha nile rụrụ ọrụ, onye ọbụla bdịka ume ya ha.

27 Ma ha akere ihe ha nwere, onye ọbụla dịka ihe nke o nwere siri dị, nye bndị ogbenye, na ndị nọ na mkpa, na ndị ọrịa, na ndị a na-akpagbụ; ma ha eyighị uwe oke ọnụ ahịa, ma na ha dị ọcha maa mma ile anya.

28 Ma otu a ha hiwere ihe nile nke nzukọ-nsọ ahụ; ma otu a ha malitere inwe udo esepụghị aka ọzọ, na-agbanyeghị mkpagbu ha nile.

29 Ma ugbua, n’ihi iguzosi ike nke nzukọ-nsọ ahụ ha malitere aịba ụba karịa, na-enwe ihe nile n’ujụ ihe ọbụla ha chọrọ—igwe anụ n’ujụ na igwe anụmanụ, na anụ nile gbara abụba nʼụdị dị iche iche, na kwa uju mkpụrụ-akụkụ-ubi, na nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ihe ndị dị oke-ọnụ-ahịa, na uju nke bakwa silk na ọmarịcha akwa linen agbakọrọ agbakọ, na ụdị akwa ọma nile dị iche iche kwesịrị ekwesị.

30 Ma otu a an’ọnọdụ ime nke ọma ha nile, ha achụpụghị ndị ọbụla bgba ọtọ, ma-ọbụ ndị agụụ na-agụ, ma-ọbụ ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ma-ọbụ ndị na-arịa ọrịa, ma-ọbụ ndị a na-azụbeghị azụ; ma ha etinyeghị obi ha nile n’akụ na ụba; ya mere ha na emepụ aka nye mmadụ nile, ma okenye ma nwata, ma oru ma ndị nwere onwe ha, ma nwoke ma nwanyị, ma ha anọghị n’ime nzukọ-nsọ ahụ ma-ọbụ ha nọ n’ime nzukọ-nsọ ahụ, na cenweghị ịkpa-oke n’ebe ndị nọ na mkpa nọ.

31 Ma otu a ha mere nke ọma ma bụrụ ndị nwere akụ na ụba dị ukwuu karịa ndị na-abụghị nke nzukọ-nsọ ha.

32 N’ihi na ndị ahụ na-abụghị nke nzukọ-nsọ ha tinyere onwe ha n’ime mgbaasị nile, na n’ime aikpere arụsị ma-ọbụ benweghị aka-ọrụ, na n’ime cokwu na-abaghị uru, na n’ime dinwe anya ukwu nile na esem-okwu nile, na-iyi uwe oke-ọnụ-ahịa; ena-ebuli onwe ha elu n’ime mpako nke anya onwe ha; na-akpagbu, ikwu okwu ụgha, na-ezu ori, na-apụnara ihe, ịgba akwụnakwụna nile, na igbu mmadụ nile, na ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche; otu o sila dị iwu ahụ ka e tinyere na mmanye n’arụ ndị nile nke jehiere ya, otu nile o siri kwe mee.

33 Ma o wee ruo na site n’isi otu a na-etinye iwu ahụ n’arụ ha, onye ọbụla na-ata ahụhụ dịka ihe ahụ nke o meworo siri dị, ha wee dịrị juu karịa, ma ha anwaghị anwa ime ajọọ-omume ọbụla ma ọbụrụ na a matara ya; ya mere, e nwere nnukwu udo n’etiti ndị nke Nifaị ruo n’afọ nke ise nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile.