Akụ ma-ọbụ uju. Onye-nwe na-enye Ndị-nsọ ndụmọdụ ka ha ghara ịchọ ụba akụ nke ụwa ewezuga iji mee ihe ọma. Ndị-nsọ agaghị edoberịrị ịchọ ụba akụ nke ụwa n’iru tutu chọwa ala-eze nke Chineke, nke na-ejide ụba akụ nile nke ebighi-ebi (Jekọb 2:18–19 ).
Mgbe akụ na-abakarị ụba, unu atụkwasịla obi unu na ha, Abụọma 62:10 .
Akụ adịghị aba uru n’ụbọchị nke oke iwe, Ilu 11:4 .
Onye na-atụkwasị obi n’akụ ya onye ahụ ga-ada, Ilu 11:28 .
Ihe a na-ahọrọ ka ezi aha bụ karịa nnukwu ụba-akụ, Ilu 22:1 .
Lee otu ọ dịịrị ndị nwere akụ ike ịba n’ala-eze Chineke, Mak 10:23 (Luk 18:24–25 ).
Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ ihe ọjọọ nile, 1 Tim. 6:10 .
Ahụhụ na-adịrị ọgaranya ndị na-eleda ndị ogbenye anya ndị akụ ha bụkwa chi ha, 2 Nif. 9:30 .
Ndị ezi-omume etinyeghị obi ha nile na ụba akụ mana ha kerịtara ihe, ha na mmadụ nile, Alma 1:30 .
Ndị mmadụ ahụ malitere ime mpako n’ihi ụba akụ nile, Alma 4:6–8 .
A malitere igosi ihe dị iche na ndị ahụ site n’ọkwa dịka ụba akụ ha nile siri dị, 3 Nif. 6:12 .
Ụba akụ nke mgbe ebighi-ebi