Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Mọmọn


Ndị Mọmọn

Otutu-aha ahụ Mọmọn bụụrụ ndị mmadụ na-abụghị ndị otu Nzukọ-nsọ rọkọtara ya iji tụnyere ndị otu Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a. Aha ahụ sitere na akwụkwọ dị nsọ nke akwụkwọ-nsọ nke onye-amụma mgbe ochie Mọmọn chikọtara na e nyere ya aha Akwụkwọ nke Mọmọn. Aha nke Onye-nwe nyere nke a ga-eji mara ndị otu Nzukọ-nsọ ahụ bụ “Ndi-nsọ.” Ezi aha nke Nzukọ-nsọ ahụ bụ Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.