Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọgbụgba-ndụ nke Abraham


Ọgbụgba-ndụ nke Abraham

Abraham nwetara ozi-ọma na e wee chie ya echichi nye ya ọkwa nchụ-aja nke ka-ịdị elu (OznỌd. 84:14; Abr. 2:11). Ma o wee baa n’ime alụlụ di na nwunye nke Selestịal, nke bụ Ọgbụgba-ndụ nke mbuli-elu (OznỌd. 131:1–4; 132:19, 29). Abraham nwetara nkwa na ngọzi nile nke Ọgbụgba-ndụ ndị a nile ka a ga-enye ụmụ ụmụ ya n’arụ na-anwụ anwụ (OznỌd. 132:29–31; Abr. 2:6–11). Nchịkọta ọgbụgba-ndụ nile ndịa na nkwa nile ka a kpọrọ Ọgbụgba-ndụ nke Abraham. Mweghachi nke Ọgbụgba-ndụ a bụụrụ mweghachi nke ozi-ọma n’ụbọchị ikpe-azụ nile, n’ihi site na ya ka a gọziworo mba nile nke ụwa (Ndị-Gal. 3:8–9, 29; OznỌd. 110:12; 124:58; Abr. 2:10–11).