Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Matiu


Matiu

Otu Onye-ozi nke Jisus Kraịst na onye dere akwụkwọ nke mbụ n’ime Testament Ọhụrụ. Matiu, onye Juu onye bụbuurụ onye ọna-ụtụ-isi nke ndị Rom na Kapanaum, nọbụụrụ ike-kwe, n’ofufe nke Herọd Antipas. A maara ya tutu mgbanwe ya dịka Livaị, nwa-nwoke nke Alfiọs (Mak 2:14). O teghị anya mgbe a kpọsịrị ya ịbu onye na-eso ụzọ Kraịst, o nyere oriri nke Onye-nwe nọọrọ n’ime ya (Mat. 9:9–13; Mak 2:14–17; Luk 5:27–32). Matiu ike-kwe nwere mmata sara mbara nke akwụkwọ nsọ nile nke Testament Ochie na nwee ike ịhụ mmezu miri-emi nke ibu amụma n’ime ndụ nke Onye-nwe. Ihe banyere ndụ Onye-ozi ahụ mgbe ikpe-azụ bụ ntakịrị ka a matara. Otu omenala na-ekwusị ike na ọ nwụrụ ọnwụ onye e gburu n’ihi okwukwe ya.

Ozi-ọma nke Matiu

Akwụkwọ nke mbụ n’ime Testament Ọhụrụ. Ozi-ọma Matiu ikekwe ka e dere na mbụ maka ndị Juu nọ na Palestain iji ya. O jiri ọtụtụ nn̄omi sitere n’ime Testament Ochie. Isi ebum n’obi Matiu bụụrụ i gosi na Jisus bụụrụ Mesaia ahụ onye nke ndị amụma Testament Ochie kwuru maka ya. O kwusikwara ike na Jisus bụ Eze ahụ na Onye-Ikpe nke ndị mmadụ.

Maka otu isi usoro, hụ Ozi-ọma nile.