Dịka e jiri ya n’akwụkwọ-nsọ nile, ezi na ụlọ ka emejupụtara na otu di na nwunye, ụmụ-ntakịrị, na oge ụfọdụ ndị nile metụtara ha bụ ndị ha na ha bi n’okpuru otu onye isi ezi na ụlọ. Ezi na ụlọ nwekwara ike ịbụ otu nne na nna tinyere ụmụ-ntakịrị, di na nwunye na enweghị ụmụ-ntakịrị, ma-ọbụ ọbụna otu onye bi nanị onwe ya.
A ga-agọzi ezi na ụlọ nile nke ụwa n’ime gị, Jen. 12:3 (Jen. 28:14 ; Abr. 2:11 ).
Aga m abụrụ ezi na ụlọ nile nke Israel Chineke, Jer. 31:1 .
Otuto gị ga-abụ ngan’iru nke ịmịta mkpụrụ ruo mgbe nile, OznỌd. 132:19 .
Aga m enye ya okpu-eze nile nke ndụ ebighi-ebi n’ime ụwa ebighi-ebi nile, OznỌd. 132:55 .
Nrachi nke ndị bụ ụmụ nye ndị nile mụrụ ha bụ mpaghara oke ọrụ ahụ nke ozuzu oge nile akara aka, OznỌd. 138:48 .
Nwoke na nwanyị ka m kere ha, ma sị ha: Mụa nụ omụmụ, baakwa nụ ụba, Moses 2:27–28 .
Odịghị mma ka mmadụ ahụ nọdụ nanị ya, Moses 3:18 .
Adam ma Iv rụkọrọ ọrụ ọnụ, Moses 5:1 .
Abraham ga-enye ụmụ ya iwu, ma ha ga-edobe ụzọ nke Onye-nwe, Jen. 18:17–19 .
I ga-ejisi ike na-akụziri ụmụ gị okwu ndịa nile, Deut. 6:7 (Deut. 11:19 ).
Onye na-ahụ nwa ya n’anya na-ata ya ahụhụ, Ilu 13:24 (Ilu 23:13 ).
Zulite nwata n’ụzọ nke ọ ga-aga, Ilu 22:6 .
Bie ndụ n’an̄ụrị gị na nwunye nke ịhụrụ n’anya, Ekl. 9:9 .
Ụmụ gị nile ka a ga-akụziri ihe site n’aka Onye-nwe, Aịsa. 54:13 (3 Nif. 22:13 ).
Na-azụlite ha na-ọzụzụ nke Onye-nwe, Ndị-Efe. 6:1–4 (Inọs 1:1 ).
Ọbụrụ na onye ọbụla e nwetaghị ihe maka ndị nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe ahụ, 1 Tim. 5:8 .
Ọ gwasikwara ha ike dịka nna nwere ịhụnanya, 1 Nif. 8:37 .
Anyị na-ekwu maka Kraịst, ka ụmụ anyị wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya, 2 Nif. 25:26 .
Ndị dị ha na ndị nwunye ha hụrụ ụmụ ha n’anya, Jekọb 3:7 .
Unu ga-akụziri ha ịhụrịta onwe ha n’anya, na ijerịtara onwe ha ozi, Mosa. 4:14–15 .
Unu ga-echekwa ezi na ụlọ unu ọbụna ruo n’ikwafu ọbara, Alma 43:47 .
Na-ekpe nụ ekpere n’ezi na ụlọ unu nye Nna ka e wee gọzie ndị nwunye unu na ụmụ unu, 3 Nif. 18:21 .
Ndị nne na nna ga-akụziri ụmụ ha ozi-ọma ahụ, OznỌd. 68:25 .
Nwoke ọbụla kwesịrị ịkpata ihe maka ezi na ụlọ ya, OznỌd. 75:28 .
Ụmụ-ntakịrị nile nwere ihe ruru ha n’ebe nne na nna ha nọ, OznỌd. 83:4 .
Zụlite ụmụ unu n’ihè ma n’ezi-okwu, OznỌd. 93:40 .
Dozie ụlọ gị n’usoro, OznỌd. 93:43–44, 50 .
Ndị nile ji ọkwa nchụ-aja kwesịrị iji ike na-arụ-ọrụ n’ime kwado ndị ọzọ nanị site n’ịhụnanya nke iru abụọ na-adighị ya, OznỌd. 121:41 .
Nye nne gị na nna gị nnukwu ugwu, Ọpụ. 20:12 .
Nwa m nụrụ ntụzi-aka nke nna gị, Ilu 1:8 (Ilu 13:1 ; 23:22 ).
Jisus wee nọdụ n’okpuru nne na nna ya, Luk 2:51 .
Jisus wee na-eme ihe nna ya na-achọ, Jọn 6:38 (3 Nif. 27:13 ).
Na-an̄a nụ ntị n’okwu ndị mụrụ unu n’ime Onye-nwe, Ndị-Efe. 6:1 (Ndị-Kọl. 3:20 ).
Ọbụrụ na ụmụ ha ga-echegharị, mgbe ahụ ka iwe-ọkụ gị ga-atụgharịpụ, OznỌd. 98:45–48 .
Ndị ada-nwanyị nke Iv ndị kwesịrị ntụkwasị-obi wee kpọọrọ Chineke nke ezi-okwu ahụ dị ndụ isi ala, OznỌd. 138:38–39 .
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile na-egosipụta ọnọdụ ebighi-ebi nke mmekọrịta nke alụlụ di na nwunye na ezi na ụlọ. Alụlụ di na nwunye nke Selestịal na ọga n’iru nke ezi na ụlọ na-eme ka ndị di na ndị nwunye ịbụ chi nile (OznỌd. 132:15–20 .)