Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie


Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie

Imezi mmadụ na Chineke.

Dika e jiri ya n’akwụkwọ nsọ nile, ịchụ aja mgbaghara mmehie bụ ịta-ahụhụ ụgwọ dịịrị omume nke mmehie, si otua wepụ mmetụta nke mmehie n’ebe onye mmehie chegharịrị e chegharị nọ na kwere ya na Chineke imezi. Ọbụ Jisus Kraịst nani nwere ike ịchụ-aja mgbaghara mmehie zuru oke nye mmadụ nile. O nwere ike ime nke a n’ihi nhọpụta ya na ibu-ụzọ chie-echichi ya n’ime Kansụl ukwu ahụ tutu a kpụọ ụwa (Ita 3:14; Moses 4:1–2; Abr. 3:27), ịbụ ọkpara Chineke ya dị nsọ, na ndụ ya na-enweghị mmehie. Ịchụ aja mgbaghara mmehie ya gụnyere ahụhụ ya n’ihi mmehie nile nke mmadụ n’ime Ogige-ubi Getsemane, ikwafu ọbara ya, na ọnwụ ya na nsochi nke mbilite n’ọnwụ site n’ili (Aịsa. 53:3–12; Mosa. 3:5–11; Alma 7:10–13). N’ihi aja mgbaghara mmehie ahụ, mmadụ nile ga-ebili site n’ọnwụ jiri arụ na-anaghị anwụ anwụ (1 Ndị-Kọ 15:22). Aja mgbaghara mmehie ahụ na-enwetara anyị ụzọ e si agbaghara anyị mmehie anyị nile, na anyị na Chineke e wee bie ruo mgbe nile. Mana onye ahụ ruworo afọ nke nkọwasi, ma nwetawo iwu ahụ nwere ike nweta ngọzi ndị a nile nanị ma o nwee okwukwe na Jisus Kraịst, chegharịa site na mmehie ya nile, nweta emume nsọ nile nke nzọpụta, na rube isi n’iwu nsọ nile nke Chineke. Ndị ahụ na-eruteghị n’afọ nkọwasị na ndị ahụ na-enweghị iwu ka a gbapụtara site n’aja mgbaghara mmehie (Mosa. 15:24–25; Moro. 8:22). Akwụkwọ nsọ nile na-akụzi ebe o doro anya na ọbụrụ na Kraịst achụghị aja n’ihi mmehie nile anyị, ọdịghị iwu, omenala nsọ ma-ọbụ aja nke ga-emezu ọchịchọ nile nke ikpe ziri-ezi, na mmadụ agaraghị enweghachi iru Chineke (2 Nif. 2; 9).