Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Emume-nsọ nile


Emume-nsọ nile

Usoro mmemme nile dị nsọ na mmemme nile. Emume-nsọ nile jupụtara na omume nile nke nwere mpụtara nile nke mụọ. Emume nsọ nile nwekwara ike ịpụta iwu nile nke Chineke na iwu nile e dere-ede.

Emume-nsọ nile n’ime Nzụkọ nsọ gụnyere ilekọta ndị nrịrịa (Jemes 5:14–15), igọzi oriri-nsọ (OznỌd. 20:77, 79), baptism site na-ibịanye n’ime mmiri (Mat. 3:16; OznỌd. 20:72–74), ịgọzi ụmụ-ntakịrị (OznỌd. 20:70), inyefe Mụọ Nsọ (OznỌd. 20:68; 33:15), inyefe ọkwa nchụ aja (OznỌd. 84:6–16; 107:41–52), emume-nsọ nile nke temple (OznỌd. 124:39), na alụlụ di na nwunye n’ime ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide (OznỌd. 132:19–20).

Emume-nsọ a na-eme n’ihi onye ọzọ

Otu emume-nsọ nke okpukpe-chi nke onye dị ndụ na-eme n’ọnọdụ onye ahụ nke nwụrụ-anwụ. Emume-nsọ ndịa na-adị ire nanị mgbe ndị ahụ e meere emume nsọ ndị ahụ n’ihi ha nabatara ha, debe ọgbụgba-ndụ nile metụtara ha, ma a rachie ha site na Mụọ Nsọ nke Nkwa. A na-eme ụdị emume-nsọ ndị a nile taa n’ime temple nile.