Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Chineke, Chukwu


Chineke, Chukwu

Enwere mmadụ atọ dị iche iche n’ime Chukwu: Chineke, Nna ebighi-ebi ahụ, Ọkpara ya Jisus Kraịst; na Mụọ Nsọ. Anyị kweere n’ime nke ọbụla n’ime ha (Ndep. Ok 1:1). Site na mkpughe ụbọchị ikpeazụ a anyị na-amụta na Nna na Ọkpara ahụ nwere arụ nile nwere ojiji aka nke anụ arụ na ọkpụkpụ mana Mụọ Nsọ bụ onye nke mụọ, na-enweghi anụ arụ na ọkpụkpụ (OznỌd. 130:22–23). Mmadụ atọ ndị a bụ otu na-ịdị n’otu zuru oke na nkwekọrịta nke ebum-n’uche na ozizi (Jọn 17:21–23; 2 Nif. 31:21; 3 Nif. 11:27, 36).

Chineke Nna ahụ

N’ọha, ọbụ Nna ahụ, ma-ọbụ Elohim, bụ onye a na-atụnyere akara ahụ Chineke. A na-akpọ ya Nna ahụ n’ihi na-ọbụ nna nke mụọ anyị nile (Mal. 2:10; Ọnọgụ. 16:22; 27:16; Mat. 6:9; Ndị-Efe. 4:6; Ndị-Hib. 12:9). Chineke Nna ahụ bụ onye ọchịchị kachasị elu nke ụwa. O ji ike nile (Jen. 18:14; Alma 26:35; OznỌd. 19:1–3), mazuru ihe nile (Mat. 6:8; 2 Nif. 2:24), nọ n’ebe nile site na Mụọ ya (Abụọma 139:7–12; OznỌd. 88:7–13, 41). Mmadụ na Chineke nwere mmekọrịta pụrụ iche nke na-edo mmadụ iche site n’ihe nile ekere eke; ndịkom na ndịnyom bụcha ụmụ Chineke na mụọ (Abụọma 82:6; 1 Jọn 3:1–3; OznỌd. 20:17–18).

E nwere ịma-atụ ole na ole nke Chineke Nna ahụ pụtara ìhè gosi onwe ya nye ma-ọbụ kwụọ okwu nye mmadụ. Akwụkwọ-nsọ nile na-ekwu na o kwuuru Adam na Iv okwu (Moses 4:14–31) na o mere ka a mata Jisus Kraịst na ọtụtụ ohere nile (Mat. 3:17; 17:5; Jọn 12:28–29; 3 Nif. 11:3–7). Ọ pụtara ìhè nye Stiven (Ọlndoz. 7:55–56) na Joseph Smith (A—JS 1:17). N’ikpe-azụ ọ pụtara ìhè nye Joseph Smith na Sidney Rigdon (OznỌd. 76:20, 23). Nye ndị ahụ hụrụ Chineke n’anya na sachaa onwe ha n’iru ya, Chineke oge ụfọdụ nile na-enye ohere nke ịhụ na mata n’onwe ha na ọbụ ya bụ Chineke (Mat. 5:8; 3 Nif. 12:8; OznỌd. 76:116–118; 93:1).

Chineke nke Ọkpara

Chineke ahụ nke a matara dịka Jehova bụ Ọkpara ahụ Jisus Kraịst (Aịsa. 12:2; 43:11; 49:26; 1 Ndị-Kọ 10:1–4; 1 Tim. 1:1; Mkpu. 1:8; 2 Nif. 22:2). Jisus na-arụ ọrụ n’okpuru ntụzi-aka nke Nna ahụ ma nọ n’ozuzu oke nke nkwekọrịta ya na ya. Mmadụ nile bụ ụmụ nna ya ndịkom na ndịnyom, n’ihi na ọ bụ ya kachasị tọrọ n’ụmụ Elohim nile na mụọ. Ụfọdụ ntụnye-aka n’akwụkwọ-nsọ na eji okwu ahụ Chineke atụnyere ya. Iji maa-atụ, akwụkwọ-nsọ ahụ kwuru na “Chineke kere elu-igwe na ụwa” (Jen. 1:1), mana ọbụ Jisus n’ezie bụ onye okike ahụ n’okpuru ntụzi-aka nke Chineke Nna ahụ (Jọn 1:1–3, 10, 14; Ndị-Hib. 1:1–2).

Chineke nke Mụọ Nsọ

Mụọ Nsọ bụ kwa otu Chineke ma a na-akpụ ya Mụọ Nsọ ahụ, Mụọ ahụ na Mụọ nke Chineke, n’etiti aha ndị ọzọ nile na akara nile. Site na enyem-aka nke Mụọ Nsọ mmadụ nwere ike ịmata uche-obi Chineke Nna ahụ ma mara na Jisus bụ Kraịst ahụ (1 Ndị-Kọ 12:3).