Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jekob, Nwa-nwoke nke Lihaị


Jekob, Nwa-nwoke nke Lihaị

Otu onye-amụma n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn na onye dere ọtụtụ okwu chukwu nile dị n’ime akwụkwọ nile nke 2 Nifaị na Jekọb (2 Nif. 6–11; Jekọb 1–7).

Akwụkwọ nke Jekob

Akwụkwọ nke atọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Isi nke 1 na-akọ na Nifaị nyefegharịrị Jekọb akụkọ ndekọta nile ahụ na mgbe ahụ doo Jekọb na nwanne ya nwoke Josef nsọ ịbụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi nye ndị mmadụ ahụ. Isi nile nke 2–4 bụ okwu chukwu nile na-adọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha dịrị ọcha nke ndụ ime mụọ. Jekọb kụzikwara maka ọbịbịa nke Mesaia ahụ ga-agbapụta na nye kwa uche ihe mere ndị ụfọdụ n’Israel e nweghị ike nabata ya na-ọbịbịa ya. Isi nile nke 5–6 nwere ọgbụgba-ama Jekọb na ogologo akụkọ ibu amụma banyere akụkọ na ije-ozị nke ndị Israel. Isi nke 7 nwere nkọwasị nke otu onye nnupụ-isi mụtara akwụkwọ aha ya bụ Sherem, onye nke e meriri ike ya site na-igba ama dị nsọ nke Jekọb.