Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọnụ-ọgụgụ


Ọnụ-ọgụgụ

Akwụkwọ nke anọ n’ime Testament Ochie. Moses dere akwụkwọ nke Ọnụ-ọgụgụ. Akwụkwọ nke Ọnụ-ọgụgụ na-akọgharị akụkọ nke njem nke Israel site Ugwu Sainai ruo na mbara ala nile nke Moab n’oke ala nke Kenean. Otu n’ime ihe mmụta dị mkpa ọ na-akụzi bụ na ndị nke Chineke ga na-ejerịrị ìje site n’okwukwe, na-atụkwasị nkwa ya nile obi, na ọ bụrụ na ha ga-aga n’iru na mmeri. Ọ na-agụgharị ntaram ahụhụ nke Chineke nyere Israel maka erubeghị-isi ma na-enye ozi banyere iwu nile nke ndị Israel. Aha nke akwụkwọ ahụ ka e sitere na mpụta ìhè nke ịgụ ọnụ ọgụgụ nke ndị mmadụ nweta (Ọnọgụ. 1–2, 26).

Isi nile nke 1–10 na-akọ maka ime nkwadobe njem nke ndị Israel site na Sainai. Isi nile nke 11–14 na-akọwa nke ọma ịzọ njem ahụ n’onwe ya, iziga ndị nledo-ala n’ime Kenean, na ọjụjụ Israel jụrụ ịbanye ala ahụ e kwere na nkwa. Isi nile nke 15–19 dedatara iwu dị iche iche na akụkọ mere eme nile. Isi nile nke 20–36 bụ akụkọ nke afọ ikpe-azụ nke ndị ahụ n’ime ọzara.