Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Okwukwe


Okwukwe

Nchekwube n’ime ihe ma-ọbụ n’ime mmadụ. Dịka a na-ejikarị ya n’ime akwụkwọ-nsọ nile, okwukwe bụ nchekwube na ntụkwasị obi n’ime Jisus Kraịst nke na-eduru mmadụ gaa n’irubere ya isi. Okwukwe ga-adaberịrị na Jisus Kraịst ka o nwee ike iduba mmadụ na nzọpụta. Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ na-enwekwa okwukwe na Chineke Nna, Mụọ Nsọ, ike nke Ọkwa Nchụ-aja, na akụkụ ndị ọzọ dị mkpa nke ozi-ọma nke e weghachiri azụ.

Okwukwe gụyere olile-anya maka ihe nile nke na-anaghị ahụ anya, mana ha bụ ezi-okwu (Ndị-Hib. 11:1; Alma 32:21; Ita 12:6). A na-emenwu okwukwe site na-ịnụ ozi-ọma ahụ site n’ọnụ ndị nlekọta nwere ikike Chineke zitere (Ndị-Rom 10:14–17). Ọrụ-ebube anaghị arụpụta okwukwe, kama okwukwe siri ike ka a na-ewulite site na nrube-isi nye ozi-ọma nke Jisus Kraịst. N’okwu nile ọzọ, okwukwe na-esi na ezi-omume abịa (Alma 32:40–43; Ita 12:4, 6, 12; OznỌd. 63:9–12).

Ezi okwukwe na-eweta ọru ebube nile, ọ̀hụ́ nile, nrọ nile, ọgwụgwọ nile na onyinye nile nke Chineke nke ọ na-enye Ndị-nsọ ya nile. Site n’okwukwe mmadụ na-enweta nsachapụ nke mmehie nile na emesịa, ya enwe ike ibi n’iru nke Chineke. Enweghi okwukwe na-eduba mmadụ na-ịda mba, nke na-abịa n’ihi ajọọ-omume (Moro. 10:22).