Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jisus Kraịst


Jisus Kraịst

Kraịst (otu okwu Grik) na Mesaia (otu okwu Hibru) pụtara “onye e tere mmanụ”. Jisus Kraịst bụ Onye Nna buru-ụzọ mụ na mụọ (Ndị-Hib. 1:6; OznỌd. 93:21). Ọ bụ Onye Nna Mụtara Nanị Ya na anụ arụ (Jọn 1:14; 3:16). Ọ bụ Jehova (OznỌd. 110:3–4) ma ebu-ụzọ chie ya echichi nye nnukwu ọkpụkpọ oku ya tutu e kee ụwa. N’okpuru ntụzi-aka nke Nna ahụ, Jisus kere ụwa na ihe nile nọ n’elu ya (Jọn 1:3, 14; Moses 1:31–33). Meri mụrụ ya na Betlehem, biri ndụ mmehie na-adịghị, na chụọ aja mmehie zuru oke maka mmehie nile nke mmadụ nile site n’ikwafu ọbara ya na-inye ndụ ya n’elu obe (Mat. 2:1; 1 Nif. 11:13–33; 3 Nif. 27:13–16; OznỌd. 76:40–42). O bilitere site n’ọnwụ, si otu a mesie ike na mbilite n’ọnwụ ga-adịrị mmadụ nile. Site n’aja mmehie nke Jisus na mbilite n’ọnwụ ya, ndị ahụ nile na-echegharị site na mmehie ha nile na rubere iwu-nsọ nile nke Chineke isi nwere ike ibi ebighi-ebi ha na Jisus na Nna ahụ (2 Nif. 9:10–12; 21–22; OznỌd. 76:50–53, 62).

Jisus Kraịst bụ mmadụ kachasị ịdị ukwuu a mụworo n’elu ụwa nke a. Ndụ ya bụ ihe atụ zuru oke otu mmadụ nile kwesịrị ibi. Ekpere nile, ngọzi nile, na emume nile nke ọkwa nchụ-aja kwesịrị ka e mee ha n’aha ya. Ọbụ Onye-nwe nke ndi-nwe nile, Eze nke ndị eze, Onye Okìke, Onye-nzọpụta, na Chineke nke ụwa nile.

Jisus Kraịst ga-abịa ọzọ n’ike na ebube ichi eze n’elu ụwa n’oge ichi ọchịchị otu puku afọ ahụ. N’ụbọchị ikpe-azụ, ọ ga-ekpe mmadụ nile ikpe (Alma 11:40–41; JS—Mat. 1).

Nchịkọta nke ndụ ya (n’usoro ihe ndị mere eme)

Ebube nke Jisus Kraịst

Ị pụta ìhè nile nke Kraịst mgbe o nweta sịwororị anụ arụ

Ibu-amụma nile banyere ọmụmụ na ọnwụ nke Jisus Kraịst

Ịchị-eze otu puku afọ nke Kraịst

Ịgba-ama a gbara banyere Jisus Kraịst

Ikike

Ikpe

Ima-atụ nke Jisus Kraịst

Iwekwasị onwe anyị aha Jisus Kraịst

Ọdịdị nke Kraịst tutu anụ arụ

Onye-isi Nzukọ-nsọ

Ụdị nile ma-ọbụ akara nile nke Kraịst