Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ịńụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa-nchụ-aja


Ịńụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa-nchụ-aja

Ịn̄ụ-iyi bụ ịn̄ụ nkwesike ịbụ ezie na ikwesị ntụkwasị-obi nye nkwa nile nke onye ahụ. Ọgbụgba-ndụ bụ ezigbo nkwa dị n’etiti ndị dị abụọ. A na-anata ọkwa nchụ-aja nke Erọn site nanị n’ọgbụgba-ndụ. Ndị ji ọkwa nchụ-aja Melkizedek na-anata ọkwa nchụ-aja ahụ site n’ịn̄ụ iyi n’ekwughị ekwu ya na kwa site na ọgbụgba-ndụ. Mgbe ndị ji ọkwa nchụ-aja na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-ebulite ọkpụkpọ-oku ha nile elu dịka Chineke na-eduzi, Ọ na-agọzi ha. Ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị-obi ruo n’ọgwụgwụ ma na-eme ihe nile Ọ gwara ha mee, ga-anata ihe nile nke Nna nwere. (OznỌd. 84:33–39).