Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọnwụ nke arụ


Ọnwụ nke arụ

Nkewa nke arụ na mụọ. Ọdịda ahụ wetara ịnwụ anwụ na ọnwụ n’uwa (2 Nif. 2:22; Moses 6:48). Aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst meriri ọnwụ ka e wee kulie onye ọbụla site n’ọnwụ (1 Ndị-Kọ 15:21–23). Mbilite n’ọnwụ bụ onyinye e nyere mmadụ nile n’efu na-e leghi-anya ma ha mere ihe ọma ma-ọbụ ihe ọjọọ na ndụ nke a (Alma 11:42–44). Otu onye ọbụla na-ahụ ahụhụ nanị otu ọnwụ nke arụ ebe ọbụ otu mgbe ahụ anyị bilitere, arụ anyị nile enweghi ike ịnwụkwa ọnwụ ọzọ (Alma 11:45).