Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọkwa-ọru, Onye-ọrụ


Ọkwa-ọru, Onye-ọrụ

Ọnọdụ nke ikike ma-ọbụ onye ọ dịịrị n’ime otu ọgbakọ, nke e jikarịrị n’ime akwụkwọ-nsọ nile nke pụtara ọnọdụ ikike nke ọkwa nchụ-aja; o nwekwara ike ịpụta ọrụ nile e nyefere ọnọdụ ahụ ma-ọbụ onye ahụ nke na-ejide ya bụ ọnọdụ.

Onye nke na-elekọta ihe nile gbasara ihe omume ma-ọbụ arịa nke onye ọzọ. Nke ahụ onye-ọrụ na-elekọta anya ka a kpọrọ ọrụ. Ihe nile dị n’elu ụwa bụ nke Onye-nwe; anyị bụ ndị-ọrụ ya. Anyị nwere nkọwasị nye Onye-nwe, kama anyị nwere ike ikpesara ndị na-anọchite anya Chineke o nyere ikike maka ọrụ anyị. Mgbe anyị na-anata ọkpụkpọ-oku nke ije-ozị site n’aka Onye-nwe ma-ọbụ ndị odibo ya o nyere ikike, ọrụ ahụ nwere ike ịgụnye ma nke mụọ na ihe nile gbasara nke ụwa nke a (OznỌd. 29:34).