Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Tesalonaịka, Akwụkwọ-ozi e degaara nile


Ndị Tesalonaịka, Akwụkwọ-ozi e degaara nile

Akwụkwọ abụọ dị n’ime Testament Ọhụrụ. Ha bụụrụ n’izizi leta nile nke Pọl degaara ndị Tesalonaịka mgbe ọ nọọrọ na Kọrịnt n’oge nleta mbụ ọ gara na Europe gburu gburu oge dịka afọ 50 mgbe a mụsịrị Kraịst. Ọrụ ya na Tesalonaịka ka a kọwara nke ọma na Ọlndoz. 17. Pọl chọọrọ ịlọghachikwa na Tesalonaịka mana o melighị otu ahụ (1 Ndị-Tes. 2:18). Ya mere o zigara Timoti ka ọ kwalite ha inwe ọnọdụ án̄ụ̀rị na olile-anya bụ ndị a gbanwere ma wetakwara ya okwu nke otu ha na-eme. Pọl dere akwụkwọ-ozi nke mbụ n’ihi afọ-ojuju ya na nlọghachi Timoti.

Ndị Tesalonaịka nke mbụ

Isi nile nke 1–2 nwere ekele Pọl na ekpere ya maka Ndị-nsọ ahụ; isi nke 3–5 na-enye nkuzi n’ito-eto nke mụọ, ịhụnanya, ịdị-ọcha mmekọrịta, ịrụsi-ọrụ ike, na ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Jisus Kraịst.

Ndị Tesalonaịka nke abụọ

Isi nke 1 mbụ nwere otu ekpere maka Ndị-nsọ. Isi nke 2 na-ekwu maka ọbịbịa nke ngọnarị okwukwe. Isi nke 3 nwere ekpere nke Pọl maka mmeri nke ụzọ nke ozi-ọma.