Ihe omume nile ma-ọbụ ihe mmata nile nke Chineke na-enye ndị mmadụ iji gosi na ihe dị mkpa n’ime ọrụ ya e mewo ma-ọbụ gaje ime n’oge dị nso. E buwo amụma ọtụtụ ihe iriba-ama nile banyere ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Onye-nzọpụta n’ụbọchị nile ikpeazụ. Ihe iriba-ama ndị a na-enyere ndị nwere okwukwe aka ịmata atụmatụ Chineke, nwee ịdọ aka na ntị, na jikere.
Ugwu nke ụlọ Onye-nwe ka a ga-ehiwe n’elu ugwu nile, Aịsa. 2:2–3 .
Onye-nwe ga-ewelite ọkọlọtọ ma kpọkọta Israel, Aịsa. 5:26 (2 Nif. 15:26–30 ).
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị ọnwa agaghị eme ka ìhè ya chaa kwa, Aịsa. 13:10 (Joel 3:15 ; OznỌd. 29:14 ).
Ndị mmadụ ga-ejehie iwu ahụ bibie kwa ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adịgide, Aịsa. 24:5 .
Site n’uzuzu ka ndị Nifaị ga-ekwu dịka olu-okwu, Aịsa. 29:4 (2 Nif. 27 ).
Ike ka a ga-eji kpọkọta Israel, Aịsa. 49:22–23 (1 Nif. 21:22–23 ; 3 Nif. 20–21 ).
Chineke ga-ewulite otu ala-eze nke na-agaghị ebibi-ebibi, Dan. 2:44 (OznỌd. 65:2 ).
Agha, nrọ nile, na ọ̀hụ́ nile ga-ebu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ụzọ, Joel 2 .
Mba nile ga-agbakọta ibuso Jerusalem agha, Zek. 14:2 (Ezik. 38–39 ).
Ụbọchị ahụ na-abịa nke ga-ere ọkụ dịka ite ọkụ, Mal. 4:1 (3 Nif. 25:1 ; OznỌd. 133:64 ; A—JS 1:37 ).
Nnukwu oke ọdachị nile ga-adị tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, Mat. 24 (JS—Mat. 1 ).
Pọl kọwara nke ọma ngọnarị okwukwe na oge nile ahụ dị egwu nke ụbọchị ndị ikpe-azụ, 2 Tim. 3–4 .
Ndị-amụma abụọ ka a ga-egbu ma bilite n’ọnwụ na Jerusalem, Mkpu. 11 (OznỌd. 77:15 ).
A ga-eweghachi ozi-ọma n’ụbọchị ndị ikpe-azụ site na nkwusa ozi ndị mụọ-ozi, Mkpu. 14:6–7 (OznỌd. 13 ; 27 ; 110:11–16 ; 128:8–24 ).
A ga-ehiwe Babịlọn, ọ ga-ada kwa, Mkpu. 17–18 .
Ndị Leman ga-agbawa dịka okoko, OznỌd. 49:24–25 .
Ndị ajọọ mmadụ ga-egbu ndị ajọọ mmadụ, OznỌd. 63:32–35 (Mkpu. 9 ).
A ga-awụpụta agha n’elu mba nile, OznỌd. 87:2 .
Ihe iriba-ama nile, ọgba aghara nile nke ihe e kere eke nile, na ndị mụọ-ozi na-akwado ụzọ make ọbịbịa nke Onye-nwe, OznỌd. 88:86–94 .
Ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa, OznỌd. 112:23–24 .
Onye-nwe nyere Ndị-nsọ iwu ka ha kwadobe maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, OznỌd. 133 .