Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 13


Nkeji 13

Echichi nke Joseph Smith na Oliver Cowdery baa n’Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn n’ogologo ala dị n’akụkụ Osimiri Susquehanna, n’akụkụ Harmony, Pennsylvania, 15 Mee 1829 (History of the Church, 1:39–42). Echichi nke sitere n’aka mụọ-ọzị, onye kpọrọ onwe ya otu onye ahụ akpọrọ Jọn O Me Baptism na Testament Ọhụrụ. Mụọ-ozi ahụ kọwara na ya na-arụ ọrụ sịte na-ntụzi-aka nke Pịta, Jemes na Jọn, ndị-ozi ochie, ndị jikwarịị ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa onye nchụ-aja di elu karịa, nke a kpọrọ Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek. E kwere nkwa nye Joseph na Oliver na mgbe oge ruru na a ga-enyefe ha Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek. (Lee nkeji 27: 7, 8, 12.)

Ọtụghe-ụzọ nile na ike nile nke Ọkwa Nchụ-aja Erọn ka e gosipụtara.

1 N’elu unu ndị odibo ibe m, site n’aha nke Mesaịa ka m ana-enyefe bỌkwa Nchụ-aja nke Erọn, nke ji ọtụghe-ụzọ nile nke nkwusa ozi-ọma nke cndị mụọ-ozi, na nke ozi-ọma nke dnchegharị, ma nke eime-baptism site n’ịmịkpụ n’ime mmiri maka nsachapụ nke mmehie nile; ma nke a enweghi mgbe a ga-ewepụ ya ọzọ site n’ụwa, rue mgbe ụmụ nwoke fLivaị ga-enye Onye-nwe onyinye ọzọ gn’ezi-omume.