Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 120


Nkeji 120

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Far West, Missouri, 8 Julaị 1838, ikwupụta nkesasị nke arịa nile nke atụrụ n’otu ụzọ n’ụzọ iri dịka akpọrọ ya aha na mkpughe nke a na-eso, nkeji 119 (History of the Church, 3:44).

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru, oge ahụ abịawo ugbụ a, na a ga-ekesasị aya site n’aka otu kansụl, nke ndị mejupụtara ya bụ Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Nzukọ-nsọ m, na nke ụkọchukwu na kansụl ya, na site na kansụl m dị elu, na site n’olu nke m nye ha, ka Onye-nwe kwuru. Ọ bụna otu a-Amen.

      • NB ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.