Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 102


Nkeji 102

Usoro eji nwee nzukọ nke nhazi nke otu kansụl dị elu nke nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio, 17 Februarị 1834 (History of the Church, 2:28–31). Usoro eji nwee nzukọ nke mbụ ka ndị okenye Oliver Cowdery na Orson Hyde depụtara. Mgbe ụbọchị abụọ gasiri, usoro ahụ ejiri nwee nzukọ ka onye-amụma meziri, a gụpụtara ya nye ndị otu kansụl dị elu, ma ndị kansụl nabatara ya. Ama-okwu iri atọ (30) ruo iri atọ na abụọ (32), ebe metụtara Kansụl nke Ndị-ozi Iri na Abụọ, ka Onye-amụma Joseph Smith tinyere na 1835 mgbe ọ kwadoro nkeji nke a maka mbipụta n’ime Ozizi na Ọgbụgba Ndụ nile.

1–8, Otu kansụl dị elu ka-ahọpụtara idozi ọkpụrụkpụ ihe nile dị ike nke pụtara na Nzukọ-nsọ; 9–18, E nyere ụkpụrụ nile e ji anụrụ ikpe nile; 19–23, Onye-isi nduzi nke kansụl ga-agụpụta ihe ekpebiri; 24–34, ụkpụrụ eji ekpe-ikpe mkpeghari ka edepụtara.

1 N’ụbọchị taa kansụl ọha nke ndị isi nchụ-aja iri abụọ na anọ gbakọrọ n’ụlọ nke Joseph Smith, nta, site na mkpughe, ma malite ịhazi akansụl dị elu nke nzukọ-nsọ nke Kraịst nke ga-enwe ndị isi nchụ-aja iri na abụọ, na ndị-isi nduzi otu ma-ọbụ atọ dịka ikpe ahụ chọrọ.

2 Otu kansụl dị elu ahụ ka ahọpụtara site na mkpughe maka ebu m n’obi nke idozi ọkpụrụkpụ ihe nile dị-ike nke nwere ike ịpụta na Nzukọ-nsọ, nke n’enweghi ike kpebie na Nzukọ-nsọ ma-ọbụ na kansụl nke aonye-ụkọchukwu ruo na mmasị nke ndị nile ọ gbasara.

3 Joseph Smith, Nta, Sidney Rigdon na Fredrick G. Williams ka a nabatara dịka ndị-isi nduzi site na otu olu nke kansụl; ma Joseph Smith, Ukwu, John Smith, Joseph Coe, John Johnson, Martin Harris, John S. Carter, Jared Carter, Oliver Cowdery, Samuel H. Smith, Orson Hyde, Sylvester Smith, na Luk Johnson, ndị-isi-nchụ-aja, ka a họputara ị bụ kansụl ga-adigide nye Nzukọ-nsọ, site na mkwekọrịta n’otu olu, nke kansụl.

4 Ndị kansụl nile a ndị a kpọrọ aha ka a jụrụ ma ha nabatara nhọpụta ha nile, na ma ha ga-arụkwa n’ọkwa nke a dịka iwu nke elu-igwe, nke ha nile zaghachiri na ha nabatara nhọpụta ha, na ha ga-emezu ihe nile a chọrọ site n’amara Chineke nke e nyere ha.

5 Ọnụ-ọgụgụ ahụ nke mejupụtara kansụl ahụ, ndị tuliri aka n’aha na n’ihi Nzukọ-nsọ n’ihọpụta ndị kansụl akpọrọ aha di iri anọ na atọ, nke bụ, ndị-isi-nchụ-aja iteghete, ndị okenye iri na asaa, ndị nchụ-aja anọ, na ndị otu iri na atọ.

6 Ekwekọrịtara: Na otu kansụl dị elu agaghị enwe ike ịrụ-ọrụ ma ọ bụrụ na mmadụ asaa ndị a akpọrọ aha adịghị n’etiti ha, ma-ọbụ ndị ahọpụtara ịnọchita anya ha ịdị ya.

7 Asaa ndị a ga-enwe ike ịhọpụta ndị-isi nchụ-aja ndị ọzọ, ndị ha nwere ike ịkwado na ha tozuru oke ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ndị kansụl na-anọghị ya.

8 Ekwekọrịtara. Na mgbe ọbụla oghere pụtara site n’ọnwụ, ma-ọbụ iwepụ n’ọkwa ọrụ site na njehie, ma-ọbụ i pụ ebe Nzukọ-nsọ n’erutaghị, nke onye ọbụla n’ime kansụl a kpọrọ aha, a ga-edochi ya site na ntụzi-aka nke onye-isi nduzi ma-ọbụ ndị-isi nduzi, ma nwee nkwado site n’olu nke ndị kansụl nile nke ndị isi nchụ-aja, nke akpọkọtara maka ịrụ ọrụ nkea n’aha nke Nzukọ-nsọ.

9 Onye-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ, onye bụ kwa onye-isi nduzi nke kansụl, ka ahọpụtara site na amkpughe, ma nweta bnkwado n’ọkwa ọrụ ya site n’olu nke Nzukọ-nsọ ahụ.

10 Na ọ bụ dịka ugwu nke ọkwa-ọrụ ka ọ ga-eji nọrọ n’isi nke kansụl nke Nzukọ-nsọ; ma ọ bụ ohere ya inwe ndị-isi nduzi abụọ ọzọ, a họpụtara otu ahụ e siri họpụta ya onwe ya.

11 Ma ọ bụrụ na otu ma-ọbụ abụọ ndị ahụ a họpụtara i nyere ya aka anọghị ya, o nwere ike ịnọ n’isi kansụl n’enweghi onye enye m-aka; ma ọ bụrụ na ya onwe ya anọghị, ndị-isi nduzi ndị ọzọ ahụ nwere ike ị nọ n’isi n’ọnọdụ ya, ha abụọ ma-ọbụ otu n’ime ha.

12 Mgbe ọbụla ahaziri otu kansụl dị elu na Nzukọ-nsọ nke Kraịst, dịka usoro nke ekwuru, ọ ga-abụ ọrụ dịrị ndị kansụl iri na abụọ ahụ ife nza site na ọnụ-ọgụgụ, ma site otu a mata onye n’ime iri na abụọ ahụ ga-ekwu okwu mbụ, malite n’onye mbụ ma ga-n’usoro ruo onye nke iri na abụọ.

13 Mgbe ọbụla kansụl nke a gbakọrọ ịhụ maka okwu ọbụla, ndị kansụl iri na abụọ ahụ ga-atule, imara ma-ọbụ ihe siri ike ma-ọbụ n’ọdịghị, ọ bụrụ na ọ dịghị, mmadụ abụọ nani n’ime ndị kansụl ga-ekwu maka ya, dịka n’ụdị e kwuru na mbụ.

14 Mana ọ bụrụ na-echee n’ọ bụ nke siri ike, a ga-ahọpụta mmadụ anọ; ọ bụrụ na o siri ike karia, mmadụ isii; mana o nweghị okwu a ga-ahọpụta karia mmadụ isii ikwu.

15 Onye ahụ eboro ebubo, n’ikpe nile, ga-enwe nkwado nke ọkara ndị kansụl, iji gbochie mkparị ma-ọbụ ikpe n’ezighi ezi.

16 Ma ndị kansụl ahọpụtara ikwu n’iru kansụl ga-ewepụta okwu ahụ, mgbe atụ-lesiri ihe aka ebe, n’ụzọ kwụ-ọtọ n’iru kansụl, ma onye ọ bụla ga-ekwu n’uzọ kwụ ọtọ na aikpe ziri ezi.

17 Ndị kansụl ahụ ndị tụtụtara nkewa abụọ, nke bụ, abụọ, ano, isii, asatọ, iri, na iri na abụọ bụ ndị ga-eguzo na ọnọdụ onye eboro ebubo, na gbochie mkparị na ikpe n’ezighi ezi.

18 N’ime ikpe nile onye boro ebubo na onye eboro ebubo ga-enwe ohere ikwuru onwe ha n’iru kansụl, mgbe a nụsịrị ihe aka-ebe nile na ndị kansụl nile ndị ahọpụtara ikwu okwu n’ikpe ahụ kwusịrị ihe nile.

19 Mgbe a nụsịrị ihe aka-ebe nile, ndị kansụl nile, Onye boro ebubo na onye eboro ebubo, kwusịa okwu, onye-isi nduzi ga-enye mkpebi site na nghọta nke ọ ga-enwe site n’okwu ahụ, na kpokuo ndị kansụl iri na abụọ ahụ ka ha kwado ya site na ntuli aka.

20 Mana ọ bụrụ na ndị kansụl fọdụrụ, ndị n’ekwughị uche ha, ma-ọbụ onye ọbula, mgbe ọ nụchara ihe aka ebe nile na arịrịọ nile n’enweghi ndọnye-ukwu, chọpụtara amaghị-eme na mkpebi nke onye-isi nduzi, ha ga-egosipụta ya, ma a ga-anụghari ikpe ahụ ọzọ.

21 Ma ọ bụrụ, mgbe e jiri nleru anya nwee ikpe-mkpegharị, enwee ezi-okwu ọhụrụ n’ikpe ahụ, mkpebi ahụ ka a ga-agbanwe dịka achọrọ ya.

22 Mana ọ bụrụ, na-ahụtaghị ezi-okwu ọhụrụ, mkpebi nke mbụ ga-adigide, ndị ka n’onụ-ọgụgụ na kansụl nwere ike ikpebi otu ihe ahụ.

23 Ọ bụrụ na-enwe ihe ike gbasara aozizi ma-ọbụ ụkpụrụ, na ọ bụrụ kwa n’enweghi ihe zuru oke edere ede ime ka okwu a pụta ìhè n’uche kansụl ahụ, onye-isi nduzi ahụ ga-achọ ịmata site n’ịchọ iru Onye-nwe site na bmkpughe.

24 Ndị isi nchụ-aja, mgbe ha nọ na mba ọzọ nwere ike ịkpọ ma hazie kansụl a site n’ụzọ nke ekwuru, i dozi nsogbu nile, mgbe ndị otu nile ma-ọbụ onye n’ime ha ga-arịọ ya.

25 Na kansụl ahụ nke ndị isi nchụ-aja ga-enwe ike ịhọpụta otu n’ime ha ị nọ n’isi iduzi kansụl n’oge ahụ.

26 Ọ ga-abụ ọrụ nke kansụl ahụ izipụ, otụ mgbe ahụ, otu kọpi akụkọ ndekọta nile, jiri okwu igba ama n’eso mkpebi ha, ruo otu kansụl dị elu nke ọnọdụ Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Nzukọ-nsọ.

27 Ọ bụrụ na ndị ekpere ikpe ma-ọbụ otu onye n’ime ha enweghi afọ ojuju na mkpebi nke kansụl ahụ, ha ga-arịọ kansụl dị elu nke ọnọdụ Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Nzukọ-nsọ, ma nwee ikpe-mkpegharị, ikpe nke a ga-ahazi n’ebe ahụ, dịka usoro nke mbụ edere, dịka enwebeghi mkpebi dị otu a.

28 Kansụl nke a nke ndị isi nchụ-aja nọ na mba ka a ga-akpọ nani n’okwu ndị kachasị asie ike gbasara Nzukọ-nsọ; na o’nweghi ikpe nke zuru ọha ma-ọbụ okwu nkiti ga-etozu oke iji kpọọ udi kansụl a.

29 Ndị isi nchụ-aja na-agagharị-agagharị ma-ọbụ ndị edotara na mba nwere-ike ikwu ma o kwesịrị ịkpọ ụdị kansụl a ma-ọbụ n’ọdịghị.

30 Ọ di ihe di iche n’etiti otu kansụl dị elu ma-ọbụ ndị isi-nchụ-aja na-agagharị agagharị nọ n’obodo ọzọ, na ndị otu kansụl dị elu ana-agagharị agagharị nke bndị ozi iri na abụọ ahụ mejupụtara, na mkpebi ha nile.

31 Site na mkpebi nke ndị mbụ e nwere ike inwe arirịọ mkpegharị ikpe, mana site na mkpebi nke ndị nke ọzọ a gaghị enwe ike ya.

32 Nke ikpeazụ ka a ga-akpọ n’ajuju site n’aka ndị ji ikike zuru ọha nile nke Nzukọ-nsọ mgbe o metụtara njehie.

33 Nkpebi: na onye-isi nduzi ma-ọbụ ndị-isi nduzi nke ọnọdụ Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Nzukọ-nsọ ga-enwe ike ikpebi ma ikpe dị otu a, dịka nke ana-ario mkpe-gharị ya, ma o ziri ezi inwe mkpegharị, mgbe enyochasịrị arịrịọ ahụ na ihe aka-ebe nile na okwu nile na-eso ya.

34 Ndị kansụl iri na abụọ ahụ wee ga n’iru ife nza ma-ọbụ ituli-aka, iji mara onye mbụ ga-amalite ikwu okwu, ma nke a bụ ihe ọpụtara otua: 1, Oliver Cowdery, 2, Joseph Coe; 3, Samuel H. Smith; 4, Luk Johnson; 5, John S. Carter; 6, Sylvester Smith; 7, John Johnson; 8, Orson Hyde; 9, Jared Carter; 10, Joseph Smith, Ukwu; 11, John Smith; 12, Martin Harris. Mgbe ekpesịrị-ekpere, eyigharịrị ọgbakọ ahụ.

Oliver Cowdery

Orson Hyde

Ndị ode akwụkwọ