Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 20


Nkeji 20

Mkpughe na nhazi Nzukọ-nsọ na ọchịchị, e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma, Epril 1830 (History of the Church, 1:64–70). Tutu ya e detuo mkpughe nke a Onye-amụma dere, “Anyị natara site na Ya [Jisus Kraịst] nke a na-eso, site na mụọ nke ibu-amụma na mkpughe; nke n’enyeghị anyị nanị nnukwu akụkọ, kama gosikwa anyị ụbọchị ahụ na nke, dịka uche Ya na iwu-nsọ siri dị, anyị ga-aga n’iru ihiwe Nzukọ-nsọ Ya ọzọ n’ebe a n’elu ụwa (History of the Church, 1: 64).

1–16, Akwụkwọ nke Mọmọn gosipụtara ịdị-nsọ nke ọrụ nke ikpeazụ a; 17–28, Ozizi nile nke okike, ọdịda, aja-mgbaghara mmehie, na ime baptism ka ekwenyere; 29–37, Iwu nile na-achị nchegharị, nkwado-izi-ezi, nsacha, na ime baptism ka e doziri; 38–67, Ọrụ nile nke ndị okenye, ndị nchụ-aja, ndị nkuzi, na dịkọn nile ka a chịkọtara; 68–74, Ọrụ nile nke ndị otu, ngọzi nke ụmụ-ntakịrị, na ụdị nke ịme baptism ka e kpughere; 75–84, Ekpere oriri-nsọ na usoro nile nke na-achị ịbụ-onye-otu ka e nyere.

1 aMbilite nke bNzụkọ nke Kraịst n’ụbọchị ikpe azụ a, ebe ọ bụ otu puku na narị afọ asatọ na iri atọ site na mgbe ọbịbịa nke Onye-nwe anyị na Onye-nzọpụta anyị Jisus Kraịst n’anụ arụ, ebe ọ bụ na a chaziri ya n’ụzọ ziri-ezi ma hiwe ya ka o kwekọta n’iwu nile nke mba anyị, sịte na uche na iwu-nsọ nile nke Chineke, n’ọnwa nke anọ n’ụbọchị nke isii n’ọnwa a na-akpọ Epril —

2 Iwu-nsọ nile nke e nyere Joseph Smith, Nta, onye nke Chineke akpọrọ, ma chie ya bonye-ozi nke Jisus Kraịst, ka ọ bụrụ cokenye mbụ nke nzukọ-nsọ nke a;

3 Ma nye Oliver Cowdery onye Chineke kpọkwara, onye-ozi nke Jisus Kraịst, ka ọ bụrụ okenye nke abụọ nke nzukọ-nsọ nke a, ma chịe ya echichi n’okpuru aka nke ya;

4 Ma nke a dịka amara nke Onye-nwe anyị na Onye-nzọpụta Jisus Kraịst siri dị, onye ọ bụ ya ka otuto nile dịịrị, ma ugbụ a ma na ruo mgbe nile. Amen.

5 Mgbe e gosipụtasịrị nye onye okenye mbụ a na o nwetawo nsacha nke mmehie ya nile, ihe efu nke ụwa bịakwara ajigide ya ọzọ;

6 Mana mgbe o chegharịsịrị ma weda onwe ya ala n’ezie, site n’okwukwe, Chineke kụziiri ya site n’aka amụọ-ọzi dị nsọ, onye bmbara iru ya dịịrị ka amụma, na onye uwe-nsọ ya n’enweghi ntụpọ ma dị ọcha karịa ihe nile ndị dị ọcha;

7 Ma nye ya iwu-nsọ nile nke kwalitere mụọ ya;

8 Ma nye ya ike sitere n’elu, site an’ụzọ nke a kwadororịị, ịtụgharị-asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn;

9 Nke nwere akụkọ-ndekọta nke ndị dara-ada, na auju nke bozi-ọma nke Jisus Kraịst nye ndị Jentaịlụ nile nakwa ndị Ju;

10 Nke e nyere site na nkwalite mụọ, na nke emesiri ike nye andị ọzọ sịte na nkwusa ozi-ọma nke ndị mụọ-ozi, ma a bna-ekwupụta ya nye ụwa nile site n’aka ha—

11 Na-egosi ụwa nile na Akwụkwọ-nsọ nile bụ aezi-okwu, ma na Chineke bna-akpalite mụọ ndị mmadụ ma kpọọ ha cn’ọrụ ya dị nsọ n’oge a ma n’ọgbọ a, nakwa dịka n’ọgbọ ndị ochie;

12 Site otu a, na-egosi na ya bụ aotu Chineke ụnyahụ, taa, na ruo mgbe nile. Amen.

13 Ya mere, ebe o nwere nnukwu ndị-aka-ebe, site na ha a ga-ekpe ụwa ikpe, ọbụna ka ha ra bụ ndị ga-abịa n’ọmụma-ihe nke ọrụ a ma e mesịa.

14 Ma ndị ahụ na-anata ya n’okwukwe, ma na-arụ ọrụ aezi-omume, ga-anata bokpu-eze nke ndụ ebighi-ebi;

15 Mana ndị na-emesi obi ha nile ike an’ekweghị-ekwe, ma jụ ya, ọ ga-atụgharị bụrụ ọmụma ikpe ọkụ ala mụọ ha—

16 N’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo ya; ma anyị, ndị okenye nke nzukọ-nsọ, anụwo ma gbaa-ama n’okwu nile nke otuto Ụdị-eze dị ukwuu dị n’elu, onye otuto dịịrị ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.

17 Site n’ihe ndị a anyị amatara na e nwere bChineke n’elu-igwe, onye n’enweghị oke ma dị ebighi-ebi, site na mgbe nile na-adigide ruo na mgbe nile na-adigide otu Chineke n’agbanweghi-agbanwe, onye kere elu-igwe na ụwa, na ihe nile nke dị n’ime ha;

18 Ma na o akere mmadụ, nwoke na nwanyị, dịka bụdị ya ma n’oyiyi ya, ka o kere ha;

19 Ma nye kwa ha iwu-nsọ nile ka ha wee ahụ ya n’anya ma bfee ya ofufe, Chineke nke dị ndụ ma bụrụ kwa nke ezi-okwu, ma na ọ bụ ya ga-abụkwa nani onye anyị cga-efe.

20 Kama site na njehie nke iwu ndị a dị nsọ mmadụ bịara nwee ammetụta nke anụ arụ na bonye na-eso ekwensu, ma buru conye dara-ada.

21 Ya mere, Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile nyere Ọkpara Ọ aMụrụ Nanị ya, dịka e dere ya n’akwụkwọ-nsọ ndị e nyere maka ya.

22 Ọ tara-ahụhụ aọnwụnwa nile mana o geghị ha ntị.

23 A akpọgburu ya, ọ nwụọ, ma bbilie ọzọ n’ụbọchị nke atọ;

24 Ma ọ arịgoro n’elu-igwe, ị nọdụ n’aka-nri nke bNna, ka o jiri ike pụrụ ime ihe nile chịa dịka uche nke Nna siri dị;

25 Ma ka ha ra bụ ndị akwere ma e mee ha baptism n’aha nsọ ya, ma bnagide n’ime okwukwe rue ọgwụgwụ, ka a ga-azọpụta—

26 Ọbụghị nanị ndị kwere mgbe ọ bịachara an’etiti oge akara-aka, n’anụ arụ, kama ndị nile site na mmalite, ọbụna ka ha ra bụ ndị nọ tutu ya abịa, ndị kwere n’okwu nile nke bndị-amụma di nsọ, ndị kwuru dịka ha nwere nkwalite mụo site cn’onyinye nke Mụọ Nsọ, ndị dgbara ama n’ezie n’ihe nile, ga-enwe ndụ ebighi-ebi.

27 Ma kwa ndị ahụ ga-abịa ma emesịa, ndị ga-ekwere an’onyinye nile ma n’ọkpụpọ-oku nile nke Chineke site na Mụọ Nsọ, nke bna-agba-ama nke Nna na nke Ọkpara ahụ;

28 Nke Nna, Ọkpara, na Mụọ Nsọ bụ aotu Chineke, n’enweghị oke ma dị ebighi-ebi, n’enweghị nsọtụ. Amen.

29 Ma anyị matara na mmadụ nile garịrị aechegharị ma kwere n’aha nke Jisus Kraịst, ma na-efe Nna ahụ ofufe n’aha ya, ma nagide n’ime bokwukwe n’aha ya rue ọgwụgwụ, m’ọbụghị ya a gaghị cazọpụta ha n’ala-eze Chineke.

30 Ma anyị matara na ankwado-izi-ezi site bn’amara nke Onye-nwe anyị na Onye-nzọpụta anyị Jisus Kraịst bụ ihe-ziri-ezi na ezi-okwu;

31 Ma anyị makwara, na aido-nsọ site n’amara nke Onye-nwe anyị na Onye-nzọpụta anyị Jisus Kraịst bụ ihe ziri-ezi na ezi-okwu, nye ndị nile hụrụ Chineke n’anya ma na-ejekwara ya ozi bn’ike ha nile, n’uche ha nile ma n’ume ha nile.

32 Mana o nwere omume na mmadụ apụrụ ịda site n’amara ma pụọ site n’ebe Chineke dị ndu nọ;

33 Ya mere ka nzukọ-nsọ nụrụ ma kpee ekpere oge nile ka ha ghara ịdaba n’ime aọnwụnwa;

34 E, ma ọbụna ka ndị a sachaworo nụrụ kwa.

35 Ma anyị matara na ihe ndị a bụ ezi-okwu ma dịka mkpughe nke Jọn siri dị, an’etinyeghị, ma-ọbụ n’ewepụghị site n’amụma nke akwụkwọ ya, bakwụkwọ-nsọ nile, ma-ọbụ mkpụghe nile nke Chineke nke ga-abịa mgbe e mesịrị nke a site n’onyinye na ike nke Mụọ Nsọ, colu nke Chineke, ma-ọbụ nkwusa ozi-ọma nke ndị mụọ-ozi.

36 Ma Onye-nwe Chineke e kwuwo ya; ma ka ùgwù, ike na otuto dịịrị aha nsọ ya, ma ugbụ a ma n’ebighi-ebi. Amen.

37 Ma ọzọ, site n’ụzọ iwu-nsọ nye nzukọ-nsọ gbasara ụzọ a ga-esi eme baptism—Ndị nile dị umeala n’iru Chineke, ma chọọ aime baptism, ma ha jiri bobi tiwara etiwa na mụọ nile nke nchegari, ma gbaa-ama n’iru nzukọ-nsọ na ha echegharịwo n’ezie site na mmehie ha nile, ma dịrị na njikere iwekwasị onwe ha caha nke Jisus Kraịst, nwekwa dmkpebi ịjere ya ozi rue ọgwụgwụ, ma gosi n’ezie site en’ọrụ ha na ha anatawo site na Mụọ nke Kraịst rue na fnsacha nke mmehie ha nile ka a ga-anabata site na-ime baptism baa n’ime nzukọ-nsọ ya.

38 Ọrụ dịịrị ndị okenye, ndị nchụ-aja, ndị nkụzi, ndị dịkọn, na ndị-otu nzukọ-nsọ nke KraịstaOnye-ozi bụ onye okenye, ma ọ bụ okpụkpọ ya bime baptism.

39 Ma aichi ndị okenye nile, ndị nchụ-aja, ndị nkuzi na ndị dikọn;

40 Ma aigọzi achịcha na mmanya—ihe nnọchi-anya nile nke anụ arụ na ọbara nke Kraịst—

41 Na ime ndị e mere baptism andị-otu n’ime nzukọ-nsọ, site na ibịkwasị baka maka ime baptism nke ọkụ na cMụọ Nsọ, dịka akwụkwọ-nsọ nile siri dị.

42 Ma ịkuzi ihe, kọwadaruo ala, gbaa-ume, mee baptism ma lekọta nzukọ-nsọ anya;

43 Ma ime onye otu nzukọ-nsọ site n’ibikwasị aka, na kwa inye Mụọ Nsọ;

44 Ma ị nọrọ na ndu nke nzukọ nile.

45 Ndị okenye aga-edu nzukọ nile dịka Mụọ Nsọ siri tụzịere ha-aka, dịka iwu-nsọ nile na mkpughe nile nke Chineke siri dị.

46 Ọrụ dịrị aonye nchụ-aja bụ ikwusa, bikụzi, ịkọwadaruo ala, ịgba-ume na ime baptism, ma gọzie oriri-nsọ,

47 Ma jee nleta n’ụlọ onye-otu ọbụla, ma gbaa ha ume aikpe-pụta ekpere bn’olu ha ma na nzuzo ma rụzuo ọrụ nile dịịrị ha cn’ezi na ụlọ.

48 Ma o nwere ike aichi ndị nchụ-aja ọzọ, ndị nkụzi, na ndị dịkọn.

49 Ma ọ ga-anọrọ na ndu nke nzukọ nile mgbe n’enweghi onye okenye ebe ahụ.

50 Kama mgbe onye okenye nọ ebe ahụ, ihe ọ ge-eme nanị bụ ikwusa ozi-ọma, kuzie ihe, kọwadaruo ala gbaa-ume, ma mee baptism.

51 Ma jee nleta n’ụlọ onye-otu ọbụla, ma gbaa ha ume ikpepụta ekpere n’olu ha ma na nzuzo ma rụzuo ọrụ dịịrị ha n’ezi na ụlọ.

52 N’ime ọrụ ndị a nile onye nchụ-aja aga-enyere onye okenye aka ma ọnọdụ chọọ.

53 Ọrụ dịịrị aonye nkụzi bu bilekọta nzukọ-nsọ anya oge nile, ma nọnyere ma gbaa ha ume;

54 Ma hụ na enweghi ajọọ-omume na nzukọ-nsọ ma-ọbụ auche ọjọọ nye onye ọbụla, ma-ọbụ ụgha, okwu-azụ, ma-ọbụ bokwu ọjọọ;

55 Ma hụ na nzukọ-nsọ na-abịakọta ọnụ ugboro-ugboro, nakwa hụ na ndị-otu nile rụrụ ọrụ dịịrị ha.

56 Ma ọ bụ ya ga-anọrọ na nduzi nke nzukọ nile ma enweghi onye okenye ma-ọbụ onye nchụ-aja—

57 Ma ọ ga-enwe onye enyem-aka oge nile, n’ọrụ ya nile n’ime nzukọ-nsọ, site na ndị adikọn, ma ọnọdụ chọọ.

58 Kama ma-ọbụ ndị nkuzi ma-ọbụ ndị dikọn enweghi ikike ime baptism; igọzi oriri-nsọ, ma-ọbụ ịbịakwasị aka;

59 Ha ga, otu ọ dị, adọ-aka na-ntị, kọwadaruo-ala, gbaa ume, ma kuzie, ma kpọọ mmadụ nile oku ịbakwute Kraịst.

60 aOkenye ọbụla, onye nchụ-aja, onye nkuzi, ma-ọbụ onye dikọn ga-abụ onye e chiri echi dịka onyinye nile na bọkpụkpọ nke Chineke siri dị nye ya; ma a ga-echi ya site n’ike Mụọ Nsọ, nke nọ n’ime onye nke na-echi ya.

61 Ọtụtụ ndị okenye nile mejupụtara nzụkọ nke Kraịst ga-ezuko n’ọgbakọ otu ugboro n’ime ọnwa atọ, ma-ọbụ site n’ọge rue n’ọge dịka ọgbakọ ndị ahụ ga-atuzi-aka ma-ọbụ họpụta;

62 Ma ọgbakọ ndị a ga-eme ihe ọbụla bụ ọrụ nzukọ-nsọ dị mkpa ka e mee ya n’oge a.

63 Ndị okenye ga-anata akwụkwọ-ikike ha site n’aka ndị okenye ndị ọzọ, site na antuli-aka nkwagide nke nzukọ-nsọ nke ha bụ ndị-otu ya, ma-ọbụ site n’ọgbakọ ndia.

64 Onye nchụ-aja ọbụla, onye nkụzi, ma-ọbụ onye dikọn, onye nke e chiri echichi site n’aka onye nchụ-aja, nwere ike ịnara ya aasambodo n’oge ahụ, asambodo nke, mgbe e nyere ya onye okenye, ga-eme ka o tozuo inwe akwụkwọ-ikike, nke ga-enye ya ikike ịrụ-ọrụ dịịrị ya n’ọkpụkpọ oku ya, ma-ọbụ ọ ga-anata ya site n’ọgbakọ.

65 Onweghị onye ọbụla a aga-echi echichi n’ọkwa-ọrụ ọbụla na nzukọ-nsọ a, ebe e nwere ngalaba-nta ehiwere nke otu nzukọ a, n’enweghi bntụlị-aka nke nzukọ-nsọ a;

66 Mana ndị okenye nọ n’isi, ndị isi-nlekọta ngalaba-ukwu na-agagharị, ndị kansụl dị elu, ndị-isi-nchụ-aja, na ndị okenye, ga-enwe ohere nke ichi echichi, ebe n’enweghi ngalaba-nta nke nzukọ-nsọ nke a ga-enwe ntuli-aka.

67 Onye-isi nduzi ọbụla nke ọkwa nchụ-aja dị elu (ma-ọbụ onye okenye nọ n’isi), aụkọchukwu, onye kansụl dị elu, na bonye isi nchụ-aja, ka aga-echi echichi site na ntụzi aka nke ckansụl dị elu ma-ọbụ ọgbakọ zuru ọha.

68 aỌrụ dịịrị ndị-otu mgbe a nabatasịrị ha site n’ime baptism—Ndị okenye ma-ọbụ ndị nchụ-aja ga-enwe oge zuru oke iji kọwadaruo ala ihe nile gbasara nzukọ-nsọ nke Kraịst ruo na bnghọta ha, tutu mgbe ha ga-eri coriri-nsọ na ruo mgbe a ga-eme ha ndị-otu site n’ibikwasị daka nke ndị okenye, n’ihi ka e mee ihe nile n’usoro.

69 Ma ndị-otu nile ga-egosipụta n’iru nzukọ-nsọ, nakwa n’iru ndị okenye, site na nzọ-ije n’oyiyi nke Chineke ma na mkpakọrịta ụka, na ha kwesịrị ya ekwesị, ka e wee nwee aọrụ nile na okwukwe nwere nkwekọrịta na akwụkwọ-nsọ nile—na-eje ije bn’ịdị-nsọ n’iru Onye-nwe.

70 Onye-otu nzukọ-nsọ ọbụla nke Kraịst nwere ụmụ ga-akpọtara ha ndị okenye n’iru nzukọ-nsọ ndị ga-ebịkwasị ha aka n’aha nke Jisus Kraịst ma agọzie ha n’aha ya.

71 Onweghị onye a ga-anabata n’ime nzukọ-nsọ nke Kraịst m’ọbụghị ma o toruru afọ nke ainye nkọwasị n’iru Chineke, ma nwee ike nke bnchegharị.

72 aBaptism bụ ihe a ga-eme site n’ụzọ dị otu a nye ndị nile chegharịrị—

73 Onye Chineke kpọrọ ma nwere ikike sitere na Jisus Kraịst ime Baptism, ga-agaba na mmiri ya na onye nyere onwe ya maka baptism, ga-asị, na-akpọ ya n’aha ya: Ebe e nyere m ikike site na Jisus Kraịst, e mee m gị baptism n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mụọ Nsọ. Amen.

74 Mgbe ahụ ka ọ aga-abịanye onye ahụ n’ime mmiri, ma gụpụta ya ọzọ site na mmiri.

75 Ọ dị mkpa ka nzukọ-nsọ gbakọta ọnụ ugboro ugboro aiketa-oke n’achịcha na mmanya na bncheta nke Onye-nwe Jisus;

76 Ma onye okenye ma-ọbụ onye nchụ-aja ga-agọzi ya; ma site aotu a ka ọ ga-eji agọzi ya—ọ ga-egbu ikpere n’ala ya na ndị nzukọ-nsọ ma kpọkuo Nna n’ekpere dị mkpa na-asị:

77 O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị n’aha nke Ọkpara gị, Jisus Kraịst, ka ị gọzie ma doo aachịcha nke a nsọ nye mkpụrụ obi nile nke ndị nile ga-eketa oke na ya, ka ha wee rie na ncheta nke arụ nke Ọkpara gị, ma bgbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha nọ na njikere ciwekwasị onwe ha aha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya oge nile ma dna-edebe iwu-nsọ ya nile nke o nyeworo ha; ka ha wee na-enwe eMuọ ya oge nile ịnọnyere ha. Amen.

78 aỤdị nke a na-esi enye mmanya ahụ—ọ ga-ewere biko kwa, ma sị:

79 O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị n’aha nke Ọkpara gị, Jisus Kraịst, ka i gọzie ma doo ammanya nke a nsọ nye mkpụrụ obi nile nke ndị nile ga-an̄ụ site na ya, ka ha wee mee ya na ncheta nke ọbara nke Ọkpara gị, nke a kwafuru n’ihi ha; ka ha wee gbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha na-echeta ya oge nile, ka ha wee nwe Mụọ ya ịnonyere ha. Amen.

80 Onye-otu nzukọ-nsọ Kraịst ọbụla na-ejehie, ma-ọbụ a nwụdere ya mgbe ọ nọ na ndahie, ka-aga emeso dịka akwụkwọ-nsọ nile na-atuzi-aka.

81 Ọ ga-abụ ọrụ dịịrị ọtụtụ nzukọ-nsọ, mejupụtara nzukọ-nsọ nke Kraịst, iziga otu ma-ọbụ karịa ndị nkụzi ha ịga ọtụtụ ọgbakọ ndị okenye nke nzukọ-nsọ mere,

82 Jiri aaha nile edepụtara n’usoro nke ndị-otu jikọrọ onwe ha na nzukọ-nsọ ke-mgbe ọgbakọ ikpeazụ; ma-ọbụ ziga n’aka nke otu onye nchụ-aja; ka e wee nwee ndekọta zuru oke nke aha mmadụ nile nke nzukọ-nsọ ga-anọrọ n’ime akwụkwọ n’aka otu onye okenye, bụ onye ọbụla nke ndị okenye ndị ọzọ ga-ahọpụta site n’oge rue n’oge;

83 Na kwa, ọbụrụ na a achụpụwọ onye ọbụla site na nzukọ-nsọ, ka aha ha bụrụ ihe ehichapụrụ site n’akụkọ-ndekọta aha nile nke nzukọ-nsọ.

84 Ndị-otu nile na-apu site na nzukọ-nsọ ebe ha bi, ọbụrụ na ha na-aga nzukọ-nsọ n’ebe a na-amaghị ha, nwere ike iwere akwụkwọ-ozi na-akọwa na ha bụ ndị-otu ma tozuokwa oke, asambodo nke a ka onye okenye ma-ọbụ onye nchụ-aja ga-etinye aka na ya ma ọbụrụ na onye-otu na-anata akwụkwọ-ozị a bụ onye onye-okenye ma-ọbụ onye nchụ-aja maara nke ọma, ma-ọbụ ndị nkuzi ma-ọbụ ndị dikọn nke nzukọ-nsọ nwere ike itinye aka na ya.