Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 134


Nkeji 134

Nkwupụta nke ihe e kweere gbasara ọchịchị nile nke obodo na iwu nile n’ọha, a nabatara site na ntuli aka nwere nkwado nke mmadụ nile, na ọgbakọ ọha nke Nzukọ nsọ e mere na Kirtland, Ohio, 17 Ọugọst 1835 (History of the Church, 2:247–249). Oge ahụ bụ ọgbakọ nke ndị ndu nile nke Nzukọ nsọ, ndị a kpọkọtara itule ihe nile a chọrọ ka-atunye uche dị n’ime mbipụta nke mbụ nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile. N’oge ahụ, nkwupụta nke a ka-enyere mmalite okwu ndịa na-eso: ’’Ka ihe anyị kwenyere gbasara ọchịchị nile nke ụwa na ọha iwu nile ghara inwe nkọwahie ma-ọbụ nghọtahie, anyị echewo na o kwesịrị ekwesị i wepụta na-ọgwụgwụ nke akwụkwọ nke a, ebum n’uche anyị gbasara nke a (History of the Church, 2:247).

1–4, Ọchịchị nile kwesịrị ichekwa nnwere onwe nke akọ n’uche na okpukpere chi; 5–8, Madụ nile ga-ebuli ọchịchị nile nke obodo ha elu na jide ụgwọ nsọpụrụ na nrube isi nye iwu; 9–10, Ọgbakọ okpukpere chi nile ekwesighi iweghara ike nile nke ọchịchị nke obodo; 11–12, Ndị mmadụ ka o ziri-ezi nye i chekwa onwe ha nile na arịa ha.

1 Anyị kweere an’ọchịchị nile ka Chineke hiwere n’ihi ọdịmma nke mmadụ, ma ọ ga ejide ha inye bnkọwasị nke omume ha banyere ọchịchị nile ndịa, ya na ime iwu nile na-itinye ha n’ọrụ, n’ihi ọdịmma na nchekwa nke obodo.

2 Anyị kweere na-ọdịghị ọchịchị ga-adị n’udo, ma-ọbụghị ma e mere iwu nile ndị a na jide ha na-ekweghị ka e bibie ha, iji nwetara onye ọbụla annwere onwe nke bakọ n’uche, ihe ruuru ha na ichịkọta arịa na cnchekwa nke ndụ.

3 Anyị kweere na ọchịchị nile nke obodo nwere mkpa ịchọ andị-ọrụ na ndị-ikpe ime ka iwu nile nwe ike ọchịchị, na ka ha ra bụ ndị ga-enye iwu nile ike nke ọchịchị, na ndị nile ga-elekọta iwu ndịa n’ụzọ kwụ ọtọ na ikpe ziri ezi, ka e kwesịrị ịchọpụta na kwalite site n’olu okwu nke ndị mmadụ ahụ ma ọbụrụ obodo na-enwe ndị nnọchite anya; ma-ọbu uche obi nke onye-eze.

4 Anyị kweere na okpukpere chi ka Chineke hiwere, na ndị mmadụ nwe nkọwasị nye ya na nye nanị ya, n’ihi imezu ya, ewezuga ma atụmatụ okpukpe chi ha nile, na-eme ka ha mebie ihe ruru ma-ọbụ ntọhapụ nke ndị ọzọ; mana anyị ekwenyeghị n’iwu nke mmadụ kwesịrị ịmaba aka na-ihiwe ụkpụrụ nke aokpukpere chi iji kechie akọ n’uche nile nke ndị mmadụ, ma-ọbụ ịtụpụta ụdị nile nke ido ekpere n’iru ọha ma-ọbụ na nzuzo; na onye-ikpe obodo kwesịkwara igbochi mmebi iwu, mana ọ gaghị enwe ike ịchịkọta akọ n’uche, ọ ga-ata onye ikpe mara ahụhụ; mana ọ gaghị abịagbu nnwere onwe nke mkpuru obi.

5 Anyị kweere na ndị mmadụ nile garịrị akwado na kwalite elu ọchịchị nile nke obodo ebe ha bi n’ime ya, ebe ha ga-enweta nchekwa n’ime nketa oke n’ihe nile ruru ha site n’iwu nke ọchịchị nile ndị ahụ; ma na mbilite imegide ndị-isi na annupụ isi ekwesịghị ekwesị nye nwa amala ọbụla na-enweta nchekwa nke a, na o kwesịrị ka a taa ya ahụhụ kwesịrị nke a; na n’ọbụ ihe ruru ọchịchị nile itinye ụdị iwu nile dịka mkpebi nile ha nke ha gụkọtara kachasị mma inweta ọdịmma ndị ọha, n’otu oge ahụ, otu o sila dị, jide ịdị nsọ nke nnwere onwe nke akọ n’uche.

6 Anyị kweere na onye ọbụla kwesịrị ka e nye ya nnukwu ugwụ n’ihe ọbụla ọ na-arụ, ndị ọchịchị nile na ndị ikpe nile bụ ndị e dowere n’ihi nchekwa nke ndị ikpe na-amaghị, na-ịta ndị ikpe mara ahụhụ; na nye kwa aiwu nile, madụ nile ji ụgwọ nsọpụrụ na irube isi, n’ihi ewezuga ha udo na nkwekọrịta ka ọgba-aghara na mmaja ga-anọchi; iwu nile nke mmadụ ka e hiwere kpọm kwem n’ihi i hazi ihe gbasara anyị nile dịka ndị mmadụ n’onwe anyị na mba nile, n’etiti madụ na madụ; na iwu nile nke si na Chineke ka e nyere si n’elu-igwe, ha na-akọwapụta ụkpụrụ nile gbasara ihe nile nke mụọ n’ihi okwukwe na (okpukpere chi) ha abụọ ka mmadụ ga-aza nye Onye okike ya.

7 Anyị kweere na ndị ọchịchị nile, obodo nile, na ọchịchị nile nwere nkwesị, na ha ahaghị itinye iwu nile n’ihi nchekwa nke ndị mmadụ nile n’ime nnwere-onwe nke imezu okwukwe okpukpere chi ha, mana anyị ekwenyeghị na ha nwere nkwesị n’ikpe ziri-ezi ị napụ ndị mmadụ nile ohere nke a, ma-ọbụ gbochie ha n’uche ha nile, ebe ha na-ezi nsọpụrụ na nkwanye ugwu nye iwu ndị a nile, na uche nke okpukpe chi ha nile ndị a emeghị ka o zie ezie bụ mbili mmegide ndị-isi ma-ọbụ ịgba izuzu mmegide.

8 Anyị kweere na mmebi iwu kwesịrị antaram-ahụhụ dịka ịda iwu ahụ si dị; n’igbu ọchụ, nrafu nke obodo, izu ori, inapụ mmadụ ihe ya n’ike, na imebi udo ọha n’ụdị ya nile, kwesịrị ntaram-ahụhụ dịka otu mmebi iwu ndị ahụ dị na ndabere ha nye ihe ojọọ n’etiti mmadụ, site n’iwu nile nke ọchịchị ahụ ebe ha nọ mebie iwu ahụ; na n’ihi udo na-ịda jụụ nke ọha, mmadụ nile ga-azọpụ ije n’iru ma jiri ume ha weta ndị nile na-emehie megide ezi iwu nile na-ita ahụhụ.

9 Anyị ekwenyeghị na o ziri ezi ịgwakọta ike na-arụ ọrụ n’ime nke okpukpere chi, ya na ọchịchị nke obodo, nke mere n’otu ọgbakọ okpukpere chi na-enweta nkwado ma nke ọzọ ka-egbochiri n’ime ohere ya nile n’ihe nke mụọ, na ihe nile ruru ndị ọbụla bụ ndị otu ya nile, dịka ụmụ amala nile ịbụ nke agọnarịrị.

10 Anyị kweere na ọgbakọ nile nke okpukpere chi nwere nkwesi imeso ndị otu ha nile n’ihi omume na-adịghị n’usoro, dịka ụkpụrụ nile na nchịkọta nile nke ọgbakọ ahụ siri dị, ma ọbụrụ na mmeso nile ahụ bụ n’ihi njekọta na omume ọma; mana anyị ekwenyeghị na ọgbakọ okpukpere chi nwere ikike ikpe ndị mmadụ ikpe nke ikwesị inwe arịa ma-ọbụ ndụ; nke inapụ n’aka ha ihe nnweta nile nke ụwa nke a, ma-ọbụ tinye ha n’ọnọdụ mmekpa arụ nke ndụ ma-ọbụ mpaghara arụ ma-ọbụ ịta ha ahụhụ nke imerụ arụ nke elu arụ. Ha nwere ike achụpụ ha nanị site n’ọgbakọ ha, na wezuga ha site na njekọta ha.

11 Anyị kweere na ndị mmadụ ga-arịọ iwu obodo arịrịọ n’ihi ịkwụghachi mmejọ nile na mkpasu iwe nile, ebe e mere mmerụ arụ ma-ọbụ ikwesị inwe arịa, ma-ọbụ mmebi agwa, ebe iwu nile ndịa dị nke ga-echekwa ihe ndị a nile, mana anyị kweere na mmadụ nile ziri-ezi ichekwa onwe ha nile, ndị enyi ha nile, na arịa ha, na ọchịchị, site na mmegide nile na-ezighị-ezi n’iwu na mmebi ihe nile ruru ndị mmadụ n’oge ọgba aghara, ebe na-enweghi ike ịrịọta arịrịọ n’aka iwu mgbe ahụ na nweta ịkwụsị ihe mgbu.

12 Anyị kweere na o ziri-ezi i akwusa ozi-ọma nye mba nile nke ụwa, na dụọ ndị ezi omume ọdụ ka ha zọpụta onwe ha nile site na mmebi nke dị n’ụwa; mana anyị ekwenyeghị na o ziri ezi itinye aka na ndị oru, ọ bụghị ikwusara ha ozi-ọma, ma-ọbụ mee ha baptism megide uche obi na ọchịchọ ndị nna ha ukwu, ọbụghị itinye aka ebe ha nọ ma-ọbụ nwe ike na-aru ọrụ n’ime ebe ha nọ n’ebe dịkasị nta ime ha ka ha ghara inwe afọ ojuju banyere ọnọdụ ha na ndụ nke a, site na nke a tinye ndụ nile nke ndị mmadụ n’ọnụ ọnwụ; ụdị ntinye aka nke a k’anyị kweere na-ozighị-ezi n’iwu na dị njọ, na dị mmekpa-arụ nye udo nke ọchịchị nile nke kwenyere na ndị mmadụ ga-abụ ndị eji n’oru.