Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 33


Nkeji 33

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Ezra Thayre na Northrop Sweet, na Fayette, New York, Oktoba 1830 (History of the Church, 1:126–127). Na-ndekọta mkpughe nke a, Onye-amụma kweyere na “Onye-nwe dị na njikere mgbe nile ịkụziri ndị na-ejisike na-achọ n’okwukwe” (History of the Church, 1:126).

1–4, Ndị ọrụ ka akpọrọ ikwusa ozi-ọma n’oge awa nke iri na otu; 5–6, E hiwere nzukọ-nsọ, ma ndị ahọpụtara ka a ga-akpọkọta; 7–10, chegharia, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe dị nso; 11–15, Nzukọ-nsọ ka ewuworo n’elu nkume nke ozi-ọma; 16–18, kwado maka ọbịbịa nke Onye na-alụ nwunye.

1 Lee, a si m unu, ndị odibo m Ezra na Northrop, meghee nụ ntị unu ma nụrụ olu Onye-nwe Chineke unu, onye aokwu ya dị ndụ ma dịkwa ike, dị kwa nkọ karịa mma agha ọbụla nke nwere iru abụọ ruo n’ikewa njikọ nile na ụmị, mkpụrụ obi na mụọ; ma na-amazu ihe dị iche n’echiche nile na bnzube nile nke obi.

2 N’ihi n’ezie, n’ezie, a sị m unu na-akpọrọ unu ka unu welite olu unu nile dịka aolu nke opi, ikwusa ozi-ọma nye ọgbọ gbagọrọ agbagọ ma rụkwara-arụ.

3 N’ihi lee, aụbị ahụ chara-acha na-echere owuwe ihe-ụbị; ma ọ bụ kwa awa nke biri na otu, ma nke cikpe-azụ m ga-akpọ ndị ọrụ n’ime ubi vine m.

4 Ma aubi vine m bemebiwo mpekere nile; ma ọdịghị onye na-eme cihe-ọma ma-ọbụghị ole na ole; ma ha na demehie n’ọtụtụ-ụzọ n’ihi endị nchụ-aja aghụghọ ha nile ndị mebiworo n’uche.

5 Ma n’ezie, n’ezie a sị m unu, na anzukọ-nsọ nke a ka m bhiwere ma kpọpụtakwa site n’ime ọzara.

6 Ma ọbụna otu aka ahụ ọ aga-akpọkọta ndị nkem ahọpụtara si n’akụkụ banọ nile nke ụwa, ọbụna ka ha ra bụ ndị ga-ekwere n’ime m, ma gee-ntị n’olu m.

7 E, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na ubi ahụ chara-acha na-echere owuwe ihe-ubi; ya mere tinye mma iwe-ihe ubi nile ma ghọọ n’ike unu nile, echiche, na ume.

8 aMeghee ọnụ unu nile ma ha ga-eju ma unu ga-abịa dịrị ọbụna ka bNifaị nke ochie, onye jere njem site na Jerusalem n’ime ọzara.

9 E, meghee ọnụ unu nile ma egbochila, ma unu ga-achiju aukwu-ọka n’azụ unu nile, na lee, mụ onwe m nọnyeere unu.

10 E, meghee ọnụ unu nile ma ha ga-eju, na-asị; chegharịa, achegharịa, ma dozienụ ụzọ nke Onye-nwe, guzozie; n’ihi na ala-eze nke elu-igwe dị nso;

11 E, chegharịa ma mee abaptism, onye obula n’ime unu, n’ihi nsachapụ nke mmehie unu nile; e, mee baptism ọbụna site na mmiri, mgbe ahụ baptism nke ọkụ na nke Mụọ Nsọ ga-abia.

12 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, nke a bụ aozi-ọma nke m; ma chetakwa na ha garịrị enwe okwukwe na m; ma-ọbụ onweghị ụzọ a ga-esi azọpụta ha;

13 Ma n’elu ankume a ka m ga-ewu nzukọ-nsọ m; e, n’elu nkume a ewukwasịrị unu, ma ọbụrụ na unu a gaa-n’iru, bọnụ-uzọ ama nile nke ala-mụọ agaghị aka unu ike.

14 Ma unu ga-echeta andepụta nile nke nzukọ-nsọ a na ọgbụgba-ndụ nile idebe ha.

15 Ma onye ọbụla nwere okwukwe ka unu aga-eme onye-otu nzukọ-nsọ m site n’ibịkwasị baka nile, ma a ga m enye conyinye nke Mụọ Nsọ n’elu ha.

16 Ma Akwụkwọ nke Mọmọn na aakwụkwọ-nsọ ndị-ọzọ nile ka e nyere site na m maka iji bkuziere unu ihe; ma ike nke Mụọ m na-eme ka ihe nile cdị ndụ.

17 Ya mere, kwesị ntụkwasị-obi, na-ekpe ekpere oge nile, ma nwee ọwa-ọkụ unu na-njikere ma na-enwu, ma jirikwa mmanụ, ka unu nọrọ na njikere chere ọbịbịa nke aonye nalụ nwunye—

18 N’ihi lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na a na m aabịa ọsọ-ọsọ. Ọbụna otu a. Amen.