Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 31


Nkeji 31

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Thomas B. Marsh, Septemba 1830 (History of the Church, 1:115–117). Oge ahụ bụ nke na-eso ngwa-ngwa emesịrị ọgbakọ nke nzukọ-nsọ (lee isi okwu nke Nkeji 30). Thomas B. Marsh emesịwo baptism tutu ugbu a n’ọnwa ahụ ma echiwokwa ya echichi dịka onye okenye na Nzukọ-nsọ tutu e nye mkpughe nke a.

1–6, Thomas B. Marsh ka akpọrọ ịkwusa ozi-ọma ma ekwere ya nkwa nke ọdị-nma nke ezị na ụlọ ya; 7–13, E nyere ya ndụmọdụ ka o nwee ndidi, kpee ekpere oge nile, ma soro Onye-nkasị-obi.

1 aThomas, nwa m nwoke, ngọzi dịrị gị n’ihi okwukwe gị n’ọrụ m.

2 Lee, ị nwewo ọtụtụ mkpagbu n’ihi ezi na ụlọ gị; otu osila dị, a ga m agozi gị na ezi na ụlọ gị, e, ụmụ-ntakịrị gị, ma ụbọchị ahụ na-abịa mgbe ha ga-ekwere ma mara ezi-okwu ma gị na ha a bụrụ otu n’ime nzukọ-nsọ m.

3 Welite obi gị-elu ma n̄ụrịa n’ihi na oge nke mgbasa ozi-ọma gị na-abia, ma a ga atọghepụ ire gị, ma ị ga-ekwupụta aozi-ọma nke oke ọn̄ụ nye ọgbọ nke a.

4 aga-ekwupụta ihe nile nke ekpugheworo nye nwa odibo m, Joseph Smith, Nta. Ị ga-amalite ịkwusa ozi-ọma site ugbụ a gaa-n’iru, e, ịghọta mkpụrụ n’ubị ahụ bchara acha na-echere ka e ree ya ọkụ.

5 Ya mere, atụnye mma iwe ihe n’ubi gị jiri mkpụrụ obi gị nile, ma mmehie gị nile ka a bga-agbaghara gị, ma ị ga-achiju cukwu-ọka n’azụ gị, n’ihi na donye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya. Ya mere, ezi na ụlọ gị ga-adị ndụ.

6 Lee, n’ezie a sị m gị, si na ha pụọ nanị nwa mgbe nta, ma kwupụta okwu nke m, ma a ga m edoziri ha ebe.

7 E, a ga m aemeghe obi nile nke ndị ahụ ma ha ga-anabata gị. Ma a ga m ehiwe nzukọ-nsọ site n’aka gị.

8 Ma ị aga-agba ha ume ma kwado ha maka oge mgbe a ga-akpọkọta ha.

9 Nwee ogologo antachi obi na bmkpagbu nile, ekwula ihe ọjọọ megide ndị na-ekwu okwu ọjọọ. Chịa cụlọ gị n’ịdị nwayọ, ma nọgidesie ike.

10 Lee, a sị m gị na ị ga-abụ onye na-agwọ orịa nye nzukọ-nsọ, kama ọbụghị nye ụwa nile, n’ihi ha agaghị anabata gị.

11 Gaa n’ụzọ gị ebe ọbụla m chọrọ, ma a ga-enye gị sịte n’aka aOnye-nkasị-obi ihe ị ga-eme na ebe ị ga-aga.

12 aKpee ekpere oge nile, ka ị ghara-iba n’ịme bọnwụnwa ma tufuo ụgwọ ọrụ gị.

13 Kwesi antụkwasị-obi ruo ọgwụgwụ, ma lee, mụ onwe m bnọnyeere gị, okwu ndị a nile abụghị nke mmadụ ma-ọbụ nke ndị mmadụ kama nke m ọbụna Jisus Kraịst, onye mgbapụta gị, site cn’uche nke Nna. Amen.