Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 34


Nkeji 34

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Orson Pratt, na Fayette, New York, 4 Novemba 1830 (History of the Church, 1:127–128). Nwanne nwoke Pratt dị afọ iri na iteghete mgbe ahụ. ọbụ onye agbanwere rịị ma mee baptism mgbe mbụ ọ nụsịrị nkwusa ozi-ọma a ewetaghachịrị site n’ọnụ nwanne ya nwoke, Parley P. Pratt, izu isii gara aga. Mkpughe nke a ka anatara n’ụlọ Peter Whitmer, Ụkwụ.

1–4, Ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-abụ ụmụ Chineke site na Aja mgbaghara mmehie; 5–9, Ikwusa ozi-ọma na-akwado ụzọ maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ; 10–12, Ibu amụma na-abịa site n’ike nke Mụọ Nsọ.

1 Nwa m nwoke aOrson, gee ntị, ma nụrụ ma lee ihe mụ Onye-nwe Chineke, ga-ekwuru gị, ọbụna Jisus Kraịst Onye-mgbapụta gị;

2 aÌhè ahụ na ndụ nke ụwa, ìhè ahụ na-amụ n’ọchịchịrị ma ọchịchịrị ahụ aghọtaghị ya.

3 Onye ahụrụ ụwa n’anya otu a na bo cnyere ndụ nke ya, na ka ha ra bụ ndị kwere ka ha bụrụ dụmụ ndịkom nke Chineke. Ya mere ị bụ nwa m nwoke;

4 Ma angọzị ga-adịrị gị n’ihi na ikwerewo;

5 Ma nnukwu ngọzi ga-adịrị gị n’ihi aakpọrọ m gị ikwusa ozi-ọma nke m.

6 Ka i welite olu gị elu dịka olu nke opi, ga-ada ogologo oge ma na-adasikwa ike, ma atie mkpu nchegharị nye ọgbọ gbagọrọ-agbagọ ma rụkwara-arụ, na-edozi ụzọ nke Onye-nwe maka bọbibịa nke ugboro abụọ ya.

7 N’ihi na lee, n’ezie, n’ezie, a sị m gị aoge ahụ dịkwa nso n’ọba aka mgbe m ga-abịa bn’igwe ojii jiri ike ma nnukwu ebube.

8 Ma ọ ga-abụ aoke ụbọchị, n’oge nke ọbịbịa m; n’ihi mba nile dị bga-ama jijiji.

9 Kama tutu oke ụbọchị ahụ abịa, anyanwụ ga-agba ọchichiri, ma ọnwa ga-atụgharịghọọ ọbara; ma kpakpando nile agaghị amụke, ma ụfọdụ ga-ada, ma mbibi dị egwu na-echere ndị ajọọ mmadụ.

10 Ya mere, welite olu gị elu ma aegbochịla n’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo; ya mere buo-amụma, ma a ga-enye ya site bn’ike Mụọ Nsọ.

11 Ma ọbụrụ na i kwesị ntụkwasị obi, lee, mụ onwe m nọnyeere gị ruo ọbịbịa m.

12 Ma n’ezie, n’ezie, a sị m gị a na m abịa ọsọ-ọsọ. Abụ m Onye-nwe gị na Onye-mgbapụta gị ọbụna otu a. Amen.